Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 4:12 - Bible Nso

12 ayi nādọb͕u kwa onwe-ayi n'ọlu, were aka-ayi nālu ọlu: mb͕e anēkwutọ ayi, ayi nāgọzi: mb͕e anēsob͕u ayi, ayi nānagide:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Aka anyị ka anyị ji arụpụtara onwe anyị ihe anyị na-eri. Mgbe ndị mmadụ na-abụ anyị ọnụ, anyị na-agọzi ha. Mgbe ha na-ata anyị ahụhụ, anyị nọ na-enwe ndidi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 4:12
23 Iomraidhean Croise  

Ngọzi nādiri unu mb͕e ọ bula ha nāta unu uta, nēsob͕u kwa unu, nēkwu kwa ajọ ihe nile di iche iche megide unu n'okwu-ugha, n'ihim.


ma Mu onwem si unu, Nāhunu ndi-iro-unu n'anya, nēkpe kwa ekpere nye ndi nēsob͕u unu;


Ma Jisus siri, Nna, b͕aghara ha; n'ihi na ha amataghi ihi ha nēme. Mb͕e ha nēkè kwa uwe-Ya n'etiti onwe-ha ha fere nzà.


nāgọzinu ndi nābu unu ọnu, nēkpe ekpere nye ndi nākpali unu.


Chetanu okwu Mu onwem gwara unu, Orù adighi-aka onye-nwe-ya uku. Ọ buru na ha sob͕urum, ha gēsọb͕u kwa unu; ọ buru na ha debere okwum, ha gēdebe kwa nke unu.


n'ihi na ya na ha nālu otù ọlu-ǹkà ahu, ya na ha we nọgide, nālu kwa ọlu; n'ihi na ọlu-ǹkà-ha bu ikpa ákwà ulo-ikwū.


Unu onwe-unu mara na akam ndia nālutara mu onwem na ndi mu na ha nọ ihe nākpà mu na ha.


O we b͕u ikperè n'ala, were kwa oké olu ti nkpu, si, Onye-nwe-ayi, atukwasila nmehie a n'isi-ha. Mb͕e o kwusiri okwu a, o we da n'ura.


Nāgọzinu ndi nēsob͕u unu; nāgọzinu, abu-kwa-la ha ọnu.


Ma ọ buru na agu nāgu onye-iro-gi, nāzù ya; ọ buru na akpiri nākpọ ya nku, gi me ka ọ ṅua miri: n'ihi na n'ime nka i gāgukwasi icheku nēre ọku n'isi-ya.


Ònye gēkewapu ayi n'ihu-n'anya nke Kraist? Ọ̀ bu nkpab͕u, ma-ọbu oké nkpà, ma-ọbu nsob͕u, ma-ọbu oké unwu, ma-ọbu ib͕a-ọtọ, ma-ọbu ize-ndu, ma-ọbu mma-agha?


Ma-ọbu nání mu onwem na Banabas, àyi enweghi ike ighara ilu ọlu?


Anapurum ihe n'aka nzukọ Kraist ọzọ, nānara ha ego-ọlu ka m'we jere unu ozi;


Ka onye nēzu ori ghara izu kwa ori ọzọ: kama ka ọ dọb͕u onwe-ya n'ọlu, nēji aka ya abua lu ezi ihe, ka o we nwe ihe ya na onye nọ na nkpà gēketa.


N'ihi na unu nēcheta, umu-nna-ayi, ndọb͕u ayi nādọb͕u onwe-ayi n'ọlu na ihuju-anya-ayi: n'ihi na ayi nālu ọlu abali na ehihie, ka ayi we ghara ibob͕u onye ọ bula nime unu, ayi we kwusara unu ozi ọma nke Chineke.


ayi erighi kwa nri n'aka onye ọ bula n'efu, kama n'idọb͕u onye-ayi n'ọlu na ihuju-anya, nālu ọlu abali na ehihie, ka ayi we ghara ibob͕u onye ọ bula nime unu:


N'ihi na ọ bu iru nka ka ayi nādọb͕u onwe-ayi n'ọlu, nāb͕asi kwa nb͕a ike, n'ihi na ayi elewo anya Chineke di ndu, Onye bu Onye-nzọputa madu nile, ma nke kachasinu Onye nzọputa nke ndi kwere ekwe.


Onye, mb͕e anēkwuto Ya, Ọ dighi-ekwutọghachi ọzọ; mb͕e Ọ nāhu ahuhu, Ọ dighi-aba nba; kama Ọ rara Onwe-ya nye n'aka Onye ahu Nke nēkpe ikpé ziri ezi:


Ma ọ buru kwa na unu ahu ahuhu n'ihi ezi omume, ngọzi nādiri unu: ma unu atula egwu ahu ha nākpata, obi alọ-kwa-la unu miri;


ndi nādighi-ewere ihe ọjọ nyeghachi n'ọnọdu ihe ọjọ, ma-ọbu nkwutọ n'ọnọdu nkwutọ; ma kama nke ahu burunu ndi nāgọzi; n'ihi na ihe eji kpọ unu bu nka, ka unu we keta ngọzi.


Ya mere ka ndi nāhu ahuhu dika ọchichọ Chineke si di were kwa nkpuru-obi-ha n'ime ezi ihe nye n'aka Onye-òkìkè kwesiri ntukwasi-obi idebe.


Ma Maikael onye-isi-mọ-ozi, mb͕e ya na ekwensu nārurita uka banyere aru Moses, ka ọ nēkwugide ya, o nweghi anya-ike ikpe ya ikpé nkwulu, kama ọ siri, Ka Onye-nwe-ayi bara gi nba.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan