Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 3:7 - Bible Nso

7 Ya mere onye nāku abughi ihe ọ bula, onye nākwọsa miri abughi kwa ihe ọ bula; kama Chineke, Onye nēme ka ọ nāba uba, bu ihe nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Onye kụrụ mkpụrụ ahụ na onye gbara mkpụrụ ahụ mmiri adịghị mkpa. Ọ bụ Chineke onye mere ka ha too dị mkpa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 3:7
12 Iomraidhean Croise  

Ọ bughi ayi, Jehova, ọ bughi ayi, Kama ọ bu aha-Gi ka I gēnye nsọpuru, N'ihi ebere-Gi, na n'ihi ezi-okwu-Gi.


Ka idi-utọ nke Onye-nwe-ayi, bú Chineke-ayi, dikwasi ayi: Gi me kwa ka ọlu aka-ayi guzosie ike n'aru ayi; E, ọlu aka-ayi, me ka o guzosie ike.


Mba nile di ka ihe-efu n'iru Ya; dika ihe nērughi ihe-efu na ebe tọb͕ọrọ n'efu ka aguworo ha nye Ya.


Le, ha nile bu ajọ ihe; ihe-efu ka ọlu nile ha bu: ifufe na ebe tọb͕ọrọ n'efu ka arusi nile ha awuru awu bu.


ọ bu kwa ndi nile bi n'uwa ka anāgu n'ihe-efu: ọ bu kwa dika O si achọ ka Ọ nēme n'usu-ndi-agha nke elu-igwe, na n'etiti ndi bi n'uwa: ọ dighi kwa onye gēti aka-Ya ihe, si Ya, Gini ka I meworo?


Mu onwem bu osisi vine ahu, unu onwe-unu bu alaka nkem: Onye nānọgide nimem, Mu onwem kwa nime ya, onye ahu nāmi nkpuru ri nne: n'ihi na unu apughi ime ihe ọ bula ma Mu anọghi ya.


Asi kwa na enwerem onyinye ibu-amuma, mata kwa ihe-omimi nile na ihe-ọmuma nile; asi kwa na enwerem okwukwe nile, nke mere m'gēnwe ike ibubiga ugwu, ma enweghi m ihu-n'anya, abughm ihe ọ bula.


Mu onwem kuru osisi, Apọlos kwọsara ya miri; ma ọ bu Chineke nēme ka ọ nāba uba.


Ma onye nāku na onye nākwọsa miri bu otù: ma ha abua n'otù n'otù gānata ugwọ-ọlu nke aka ha, onye ọ bula dika ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu si di.


Aghọwom onye nēnweghi uche: unu onwe-unu rugiderem; n'ihi na ugwọ unu ji mu onwem bu ime ka amaram: n'ihi na ọ dighi uzọ ọ bula m'nērughi ndi kachasi elu n'etiti ndi-ozi, asi na ọ bu ezie na abughi m ihe ọ bula.


Ọ siwokwam, Amaram ezuworo gi: n'ihi na emewo ka ikem zu oké n'adighi-ike. Ya mere kama ihe ọzọ m'gēwere obi-utọ nile nya isi n'adighi-ikem nile, ka ike nke Kraist we ridakwasim, biri kwa nimem.


N'ihi na asi na madu nēchè na ya bu ihe, mb͕e ọ nābughi ihe ọ bula, ọ nāghọ onwe-ya aghughọ n'obi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan