Mb͕e ọ kpu okwu n'ọnu, le, igwe-oji nke nēnwu enwu kpuchiri ha: le kwa, olu si n'igwe-oji ahu puta, si, Onye a bu Ọkparam M'huru n'anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma; nurunu okwu-Ya.
ka ha nile we buru otù; dika Gi onwe-gi di nimem, dika Mu onwem di kwa nime Gi, Nna, ka ha onwe-ha we di kwa nime Ayi: ka uwa we kwere na Gi onwe-gi ziterem.
N'ihi na asi na ayi di ndu, ọ bu n'ebe Onye-nwe-ayi nọ ka ayi di ndu; ma asi na ayi nwuru, ọ bu n'ebe Onye-nwe-ayi nọ ka ayi nwuru: ya mere, ma ayi di ndu, ma ayi nwuru anwu, ayi bu ndi nke Onye-nwe-ayi.
Ma mb͕e ọ bula agēdowori ihe nile n'okpuru Ya, mb͕e ahu ka agēdo Ọkpara ahu Onwe-ya n'okpuru Onye ahu Nke doro ihe nile n'okpuru Ya, ka Chineke we buru ihe nile nime ihe nile.
N'ihi na onye akpọrọ nime Onye-nwe-ayi, mb͕e ọ bu orù, ọ bu onye Onye-nwe-ayi mere ka o nwere onwe-ya: otú a onye akpọrọ, mb͕e o nwere onwe-ya, ọ bu orù Kraist.
ma n'ebe ayi nọ otù Chineke di, bú Nna, Onye ihe nile sitere na Ya, Onye ayi onwe-ayi di-kwa-ra Ya; otù Onye-nwe-ayi di kwa, bú Jisus Kraist, Onye ihe nile sitere n'aka-Ya, ayi onwe-ayi site-kwa-ra n'aka-Ya.
Unu nēle ihe di n'iru unu anya. Ọ buru na onye ọ bula atukwasiwo obi n'onwe-ya na ya bu onye Kraist, ya gua nka ọzọ n'onwe-ya, na, dika ya onwe-ya bu onye Kraist, otú a ka ayi onwe-ayi bu kwa.
rue ọchichi-èzi-na-ulo nke ozuzù oge akara àkà, ichikọta ihe nile nime Kraist-ayi dika Isi, bú ihe nile di n'elu-igwe, na ihe nile di n'elu uwa; nime Ya, ka m'kwuru,