Onye ahu Nke nāzọdoghi Ọkpara nke aka Ya, kama Ọ rara Ya nye n'ihi ayi nile, Ò gēsi aṅa ghara inye kwa ayi ihe nile n'amara ebe O weresiri Onye ahu nye ayi?
Ma ihe ndia, umu-nnam, ka m'mere ka ha ghọ mu onwem na Apọlos n'oyiyi n'ihi unu; ka unu we muta nime ayi ozizì a, Unu agabigala ihe edeworo n'akwukwọ, ka unu we ghara ifuli onwe-unu elu, otù onye n'ihi otù onye megide madu-ibe-ya.
dika ndi ihe nēwuta, ma ayi nāṅuri ọṅu mb͕e nile; dika ndi-ob͕eye, ma ayi nēme ka ọtutu madu buru ọgaranya; dika ndi nēnweghi ihe, ma ayi nēnwezu ihe nile.