Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 3:17 - Bible Nso

17 Ọ buru na onye ọ bula emebi ulo nsọ Chineke, onye ahu ka Chineke gēmebi; n'ihi na ulo nsọ Chineke di nsọ, otú a ka unu di kwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Ọ bụrụ na onye ọbụla emebie ụlọnsọ Chineke, Chineke ga-emebikwa onye ahụ. Nʼihi na ụlọ Chineke bụ ụlọ dị nsọ, unu bụkwa ụlọ ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 3:17
19 Iomraidhean Croise  

Ọ tua egwu, si, Le, otú ebe a di egwù nke-uku! nka abughi ihe ọzọ ma-ọbughi nání ulo Chineke, nka bu kwa ọnu-uzọ-ama elu-igwe.


Ọzo kwa, n'ihi na ihe ulo Chinekem nātọm utọ, ebe m'nwere ihe nke akam, bú ọla-edo na ọla-ọcha, ewerewom ya nye ulo Chinekem, tukwasi ihe nile m'doziworo nye ulo nsọ ahu;


Zọlie ije ngwa ngwa ibiaru ebe nile etikpọrọ ebighi-ebi; Onye-iro emewo ihe ọjọ nile n'ebe nsọ.


Chineke, mba di iche iche abatawo n'ihe-nketa-Gi; Ha emeruwo ulo uku Gi di nsọ; Ha emewo Jerusalem ka ọ ghọ ihe etikpọro etikpọ.


Ihe-àmà-Gi nile kwesiri ntukwasi-obi nke-uku: N'ebe ulo-Gi di idi-nsọ mara nma, Jehova, rue ubọchi nile nke ndu di ogologo.


Bulienu Jehova, bú Chineke-ayi, Kpọ-kwa-nu isi ala n'ebe ugwu nsọ Ya di; N'ihi na onye nsọ ka Jehova, bú Chineke-ayi, bu.


Ọ si, Abiarula nso ebe a: yipu akpukpọ-ukwu-gi n'ukwu-gi abua, n'ihi na ebe nke gi onwe-gi nēguzo n'elu ya, ala nsọ ka ọ bu.


Ulo-ayi nke di nsọ nke ma-kwa-ra nma, ebe nna-ayi-hà toro Gi, aghọwo ihe nsure-ọku: ihe nile ayi anāchọsi ike aghọwo kwa nkpọnkpọ ihe.


Nka bu iwu ulo a: n'elu ugwu-ya ókè-ala-ya nile buruburu n'akuku nile di nsọ kachasi ebe nsọ nile. Le, nka bu iwu ulo a.


N'ihi nka, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), n'ihi na ebe nsọm ka i meruworo n'ihe-gi nile nke jọb͕uru onwe-ha, na n'ihe-árú-gi nile, n'ihi ya Mu onwem aghaghi kwa ibilata gi; anyam agaghi-eme kwa ebere; ọzọ kwa, Mu onwem agaghi-enwe ọmiko.


M'gēsi kwa n'ebe ha nọ chigharia irum, ha gēme kwa ka ebe-nzuzom ghara idi nsọ: ndi nēme ihe-ike gābà kwa nime ya, me ka ọ ghara idi nsọ.


Unu gēkewapu kwa umu Israel n'ọrurú-ha; ka ha we ghara inwu n'ọrurú-ha, mb͕e ha meruru ebe-obibim nke di n'etiti ha.


Mu onwem gēche kwa irum megide nwoke ahu, bipu ya n'etiti ndi-ya; n'ihi na ufọdu nime nkpuru-ya ka o nyeworo Molek, ka o we meru ebe nsọm, na ime ka aha nsọm ghara idi nsọ.


Ndi-amuma-ya bu ndi obi-ha nādighi n'otù ebe, ndi-nghọb͕u: ndi-nchu-àjà-ya emewo ka ihe nsọ ghara idi nsọ, ha emewo iwu ihe-ike.


Ma nwoke nke ruru árú, ma ọ dighi-ewepu nmehie-ya, agēbipu kwa nkpuru-obi ahu n'etiti nkpọkọta Israel, n'ihi na ọ bu nsọ Jehova ka ọ meruworo: awusaghi ya miri nke idi-na-nsọ ahu, onye ruru árú ka o bu.


Ùnu amataghi na unu bu ulo nsọ Chineke, Mọ nke Chineke bi kwa nime unu?


Ka onye ọ bula ghara ighọb͕u onwe-ya. Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya bu onye mara ihe n'etiti unu n'oge a, ya ghọ onye-nzuzu, ka o we ghọ onye mara ihe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan