bú Mọ nke ezi-okwu: Onye uwa nāpughi inara; n'ihi na ọ dighi-ahu ya, ọ dighi-ama kwa Ya: unu onwe-unu mara Ya; n'ihi na Ya na unu nānọgide, Ọ gānọ kwa nime unu.
Ùnu amataghi na onye unu nēche onwe-unu n'iru ya ka unu buru ndi-orù iṅa ya nti, unu bu ndi-orù nke onye ahu unu nāṅa nti ya; ma-ọbu nke nmehie nēweta ọnwu, ma-ọ̀bu nke iṅa-nti nēweta ezi omume?
Ma ọ buru na Mọ nke Onye ahu Nke mere ka Jisus si na ndi nwuru anwu bilie nēbi nime unu, Onye ahu Nke mere ka Kraist Jisus si na ndi nwuru anwu bilie gēsite kwa n'aka Mọ-Ya Nke nēbi nime unu me ka aru-unu nke puru inwu anwu di ndu.
Ma unu onwe-unu anọghi n'anu-aru, kama unu nọ nime Mọ Nsọ, ma ọ buru na ọbu ezie na Mọ nke Chineke nēbi nime unu. Ma ọ buru na onye ọ bula enweghi Mọ nke Kraist, onye ahu abughi nke Ya.
Ùnu amataghi na ndi nālu ọlu n'ulo uku Chineke nēri ihe si n'ulo uku Chineke puta, na ndi nānọ kwa n'iru ebe-ichu-àjà nēso ebe ichu-àjà ahu nēkekọ ihe?
Ọzọ, òle nkwekọ ulo nsọ nke Chineke na arusi nēkwekọ? n'ihi na ayi onwe-ayi bu ulo nsọ nke Chineke di ndu; dika Chineke kwuru, si, M'gēbi nime ha, nējeghari kwa nime ha; M'gābu kwa Chineke nke ha, ha onwe-ha gābu kwa ndi nkem.
ma Kraist kwesiri ntukwasi-obi dika Ọkpara, Nke bu onye-isi n'èzi-na-ulo-Ya; Onye ayi onwe-ayi bu èzi-na-ulo-Ya, ma ọ buru na ayi jidesie nkwuwa-okwu-ayi na inya-isi nke olile-anya-ayi ike rue ọgwugwu ihe nile.
Unu ndi nākwa iko, ùnu amataghi na ibu eyì nke uwa bu ibu onye-iro nke Chineke? Ya mere onye ọ bula nke zubere ibu eyì nke uwa nēdo onwe-ya onye-iro nke Chineke.
ewe were kwa unu onwe-unu, dika nkume di ndu, wu, ka unu buru ulo nke Mọ Nsọ, ka unu we buru òtù ndi-nchu-àjà di nsọ, ichu àjà nke di ka Mọ Nsọ si cho, nke di Chineke ezi nma site na Jisus Kraist.
Ọ dighi onye ọ bula huworo Chineke mb͕e ọ bula: ọ buru na ayi ahurita onwe-ayi n'anya, Chineke nānọgide nime ayi, emewo kwa ka ihu-n'anya-Ya zue okè nime ayi: