Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 2:7 - Bible Nso

7 kama ihe ayi nēkwu bu amam-ihe Chineke n'ihe-omimi, bú amam-ihe nke ezobeworo, nke Chineke buru uzọ ka àkà mb͕e oge ndia akērughi, iwetara ayi otuto:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Kama anyị na-ekwu okwu amamihe nke Chineke nʼụzọ dị omimi, bụ amamihe Chineke zonarịrị ụmụ mmadụ site na mbụ, nke Chineke kara aka tupu e kee ụwa na a ga-ekpughe ya nʼoge a maka iwetara anyị otuto.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 2:7
21 Iomraidhean Croise  

M'gāsaghe ọnum n'itu ilu: M'gēkwuwa okwu-omimi di iche iche n'uba, bú nke sitere na mb͕e ochie:


N'oge ahu Jisus zara, si, Ekelem I, Nna, Onye-nwe elu-igwe na uwa, na I zonariri ndi-amam-ihe na ndi nwere nghọta ihe ndia, I were kwa ha kpughere umu ọhu:


ka okwu ekwuru site n'ọnu onye-amuma we mezu, si, M'gāsaghe ọnum n'itu ilu; M'gēkwuwa ihe ezoworo ezo site na ntọ-ala uwa.


N'ihi na achọghm ka unu ghara ima ihe-omimi a, umu-nnam, ka unu ghara inwe uche n'anya onwe-unu, na emewo Israel obi-etili ufọdu, rue mb͕e ozùzù ndi mba ọzọ gābata;


N'ihi na ndi O buru uzọ mara, O bu-kwa-ra uzọ ka ha àkà, ka ha na onyinyo nke Ọkpara-Ya nwekọ otù udi, ka O we buru onye ebu uzọ mu n'etiti ọtutu umu-nna:


ma ndi O buru uzọ ka àkà, ndia ka Ọ kpọ-kwa-ra: ma ndi Ọ kpọrọ, ndia ka Ọ gu-kwa-ra na ndi ezi omume: ma ndi Ọ guru na ndi ezi omume, ndia ka O nye-kwa-ra otuto.


Mu onwem kwa, umu-nnam, mb͕e m'biakutere unu, abiaghm n'ọ̀kà okwu ma-ọbu n'ọ̀kà amam-ihe, nēkwusara unu àmà nke Chineke.


dika Ọ roputara ayi nime Ya mb͕e akātọghi ntọ-ala uwa, ka ayi we di nsọ buru kwa ndi anāpughi ita uta n'iru Ya n'ihu-n'anya:


ka ewe me ub͕u a ka ibu-isi nile na ike nile nke di n'ebe di n'elu-igwe mara ọtutu okpukpu amam-ihe Chineke di iche iche site n'aka nzukọ-Ya,


Onye zọputara ayi, were kwa ọkpukpọ di nsọ kpọ ayi, ọ bughi dika ọlu-ayi si di, kama dika ihe Ya onwe-ya zubere, na amara-Ya, si di, nke enyere ayi nime Kraist Jisus mb͕e oge ebighi-ebi akērughi,


Ọ gwara ayi okwu n'ọgwugwu ubọchi ndia nime Ọkpara, Onye O doro onye-nketa nke ihe nile, Onye O site-kwa-ra n'aka-Ya me uwa nile;


Okwukwe ka ayi ji ghọta na ewerewo okwu Chineke dozie uwa nile, ya mere esiteghi n'ihe putaworo ìhè kpu ihe ahu anāhu anya.


nēnyocha oge ọ bu ma-ọbu aha oge ọ bu, bú nke Mọ nke Kraist Nke si nime ha nēgosi, mb͕e O buru uzọ nāb͕a àmà bayere ahuhu nke Kraist, na ebube nile nke gēso ha.


Ya mere, ariọm ndi-okenye nọ n'etiti unu, onye mu onwem bu okenye-ibe-unu, ya na onye-àmà nke ahuhu nile nke Kraist, abukwam onye-nnwekọ nke ebube ahu nke agaje ikpughe:


Ma Chineke nke amara nile, Onye kpọbatara unu n'ebube ebighi-ebi Ya nime Kraist, mb͕e unu huworo ahuhu nwa oge, Ya onwe-ya gēme ka unu zue okè, me kwa ka unu guzosie ike, me kwa ka unu di ike, tọ kwa unu ntọ-ala.


dika ike O ji buru Chineke nyeworo n'aka-ayi ihe nile di ndu na nsọpuru-Chineke n'efu, site na nmazu nke Onye ahu Onye ji ebube na idi-nma nke aka Ya kpọ ayi;


Ndi nile ndi bi n'elu uwa gākpọ kwa isi ala nye ya, onye ọ bula anēdeghi aha-ya n'akwukwọ nke ndu nke Nwa-aturu ahu Onye eb͕uworo site n'oge itọ ntọ-ala nke uwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan