Otù nwanyi we nu okwu-ayi, aha-ya bu Lidia, onye nēre ihe eji esiji ákwà ododo, onye obodo Tayataira, onye nātu egwu Chineke: Onye-nwe-ayi we meghe obi-ya, iṅa nti n'ihe nile Pọl nēkwu.
Ọ siwokwam, Amaram ezuworo gi: n'ihi na emewo ka ikem zu oké n'adighi-ike. Ya mere kama ihe ọzọ m'gēwere obi-utọ nile nya isi n'adighi-ikem nile, ka ike nke Kraist we ridakwasim, biri kwa nimem.