Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 2:4 - Bible Nso

4 Okwum na ihe m'kwusara abughi kwa n'okwu amam-ihe, ime ka madu kweye, kama ha bu na ngosi nke Mọ Nsọ na nke ike:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Okwu m na ihe m kwusara abịakwaghị dịka okwu ire ụtọ na nke oke mmụta, ime ka ndị mmadụ kwere, kama ha bịara nʼụzọ igosi ọrụ nke Mmụọ Nsọ na ike ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 2:4
28 Iomraidhean Croise  

O nēkpughe ìzù nzuzo, bú onye nējeghari dika onye nāb͕a àmà ọjọ. Agwakọta-kwa-la onwe-gi n'onye ji eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua arafu madu.


O were ọtutu urà-ya wezuga nwa-okorọbia ahu ka ọ ba n'ulo-ya, O were okwu ire-utọ nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya nufue ya.


N'ihi na anuwom akukọ ọjọ nke ọtutu madu, ujọ dim buruburu. Gosinu, ayi gēgosi kwa ya, ka ha nāsi, bú ndi nile mu na ha di n'udo, ndi nēche nche n'akukum; eleghi anya agāràra ya, ayi ewe nwe ike imegide ya, bọ̀ọ ọ́bọ̀-ayi n'aru ya.


Ha ahuwo ọhù efu na iju-ase ugha, bú ndi nāsi, Ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; ma Jehova eziteghi ha: ha we le anya na ha gēme ka okwu guzosie ike.


N'ihi na egwu emeghm ka m'ghara ikọrọ unu ìzù nile nke Chineke.


Agripa we si Pọl, I nēji okwu ntà eme ka m'kweye ibu Kristian.


Ma Chineke nke olile-anya ahu mejue unu n'ọṅù nile na udo nile n'ikwe-ekwe, ka unu we nwebiga olile-anya ahu ókè, n'ike Mọ Nsọ.


n'ike nke ihe-iriba-ama na ọlu-ebube di iche iche, n'ike nke Mọ Nsọ; ya mere site na Jerusalem, na ala nke di ya gburugburu rue Ilirikọm, ezìzuwom ozi ọma Kraist;


N'ihi na ndi di otú a abughi orù nke Onye-nwe-ayi Kraist, kama orù nke afọ nke ha; ha were kwa okwu utọ ha na okwu ọma ha nāghọb͕u obi ndi nāmaghi ihe ọjọ.


N'ihi na Kraist eziteghm ime baptism, kama izisa ozi ọma: ọ bughi n'amam-ihe nke okwu, ka aghara ime ka obe Kraist buru ihe-efu.


Mu onwem kwa, umu-nnam, mb͕e m'biakutere unu, abiaghm n'ọ̀kà okwu ma-ọbu n'ọ̀kà amam-ihe, nēkwusara unu àmà nke Chineke.


Ọ bu kwa ihe ndia ka ayi nēkwu, ọ bughi n'okwu nke amam-ihe madu nēzí, kama n'okwu nke Mọ Nsọ nēzí; ayi nēwere kwa ihe nke Mọ Nsọ tule ihe nke Mọ Nsọ.


N'ihi na ala-eze Chineke adighi n'okwu-ọnu, kama n'ike.


nime idi-ọcha, nime ihe-ọmuma, nime ogologo ntachi-obi, nime obi-ọma, nime Mọ Nsọ, nime ihu-n'anya nke iru-abua nādighi ya,


N'ihi na ọ̀ bu madu ka m'nēme ka ha kweye ub͕u a, ma-ọbu Chineke? ma-ọbu ànamachọ uzọ ime ihe gātọ madu utọ? ọ buru na anọm nēme ihe gātọ madu utọ, m'gaghi-abuwori orù nke Kraist.


Nka ka m'nēkwu, ka onye ọ bula we ghara iwere ire-utọ rafue unu.


na ọ bughi nání n'okwu-ọnu ka ozi ọma ayi biaruru unu, kama ọ bia-kwa-ra n'ike, na nime Mọ Nsọ na ọtutu nkwezu; dika unu matara aha madu a huru na ayi bu n'ebe unu nọ n'ihi unu.


Ndi ekpughere nye, na ọ bughi onwe-ha, kama ọ bu unu, ka ha ji ihe ndia jere ozi, bú ihe nke akọrọ unu ub͕u a site n'ọnu ndi ahu ndi zìri unu ozi ọma nka nime Mọ Nsọ eziputara n'elu-igwe; ihe ọ nāgu ndi-mọ-ozi inyocha ha.


N'ihi na ayi esoghi akukọ-irò nke eji amam-ihe kọ, mb͕e ayi mere ka unu mara ike na ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ma emere ayi ka ayi buru ndi huru idi-uku nke Onye ahu.


N'ihi na, ebe ha nēkwu oké okwu na mbuli elu nke ihe-efu, ha were agu ikwa-iko di iche iche nārafu ndi ahu nime agu ihe ọjọ nke anu-aru, bú ndi nāb͕anari n'oge ub͕u a ndi nēbi obi na njehie;


O rue, n'ubọchi nke-asa, na ha siri nwunye Samson, Rà di-gi ọnu, ka o we gosi ayi ilu ahu, ka ayi we ghara isure gi na ulo nna-gi n'ọku: ọ̀ bu inapu ayi ihe nile ayi nwere ka unu kpọrọ ayi? ọ̀ bughi otú a?


Ndi-isi ndi Filistia we rigokuru ya, si ya, Rà ya ọnu, hu ihe ọ bu, bú nke ike uku ya di nime ya, na ihe ayi gēji pu imegide ya, ka ayi we ke ya ab͕u iweda ya n'ala: ayi onwe-ayi gēnye kwa gi, nwoke ọ bula nime ayi, nnù ọla-ọcha abua na ọgu iri-na-ise.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan