i gēdebe kwa ememe nke owuwe-ihe-ubi, bú nke nkpuru mbu nke i lutara n'ọlu, nke i nāgha n'ubi: na ememe nke nchikọta-ihe, n'ọgwugwu arọ, mb͕e i si n'ubi chikọta ihe nile i lutara n'ọlu.
N'ihi na Pọl zubereri igabiga Efesọs n'ub͕ọ, ka aghara ime ya ka ọ nọgide ogologo oge n'Esia; n'ihi na ọ nēme ngwa iru Jerusalem mb͕e ubọchi Pentikọst akērughi, ma ọ buru na ọ puru ime ya.
Ọ buru na abumri onye nālu ọ̀gù megide anu-ọhia n'Efesọs dika madu si eme, ùrù gini baram? Ọ buru na emeghi ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie, ka ayi rie ṅu kwa, n'ihi na echi ka ayi gānwu.