Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 16:2 - Bible Nso

2 Kwa ubọchi mbu n'ízù ubọchi asa ka unu nile n'otù n'otù debe ihe n'ulo nākpado ya, otú ihe nāgara onye ọ bula nke-ọma, ka aghara inara ùtú mb͕e ọ bula m'gābia.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ụbọchị ụka niile, ka onye ọbụla site nʼihe ọ kpatara nʼizu ụka ahụ wepụta ụfọdụ ihe nke ọ ga-eji nye onyinye a. Unu e cherekwala ịnakọta ihe onyinye ndị a ruo mgbe m ga-abịa. Ka a hapụ iche tutu ruo mgbe m bịara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 16:2
22 Iomraidhean Croise  

Aisak we gha nkpuru n'ala ahu, hu n'arọ ahu ọgu ise ọgu ise: Jehova we gọzie ya.


Leban we si ya, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, gi nọgide: n'ihi na aribawom ama na Jehova agọziwom n'ihi gi.


N'ihi na nwanti ka ihe i nwere bu tutu mu abia, ma ọ basawo rue ọtutu; Jehova agọziwo kwa gi n'ije-ukwum: ma ub͕u a òle mb͕e ka mu onwem gēme-kwa-ra ulom?


ekwe-sighm ebere nile, na ezi-okwu nile, nke I meworo orù-Gi: n'ihi na nkpa-n'akam ka m'were gabiga Jọdan nka; ma ub͕u a aghọwom ọmuma-ulo-ikwū abua.


Biko, nara ngọzim nke ewetaworo gi; n'ihi na Chineke emewom amara, na n'ihi na enwerem ihe nile. O rugide ya, ọ we nara ya.


Azaraia, bú onye-isi-nchu-àjà, nke ulo Zedok, we gwa ya, si, Site na mb͕e ha malitere ibubata àjà-nbuli n'ulo Jehova, ayi erijuwo afọ, rifọ kwa ihe n'uba: n'ihi na Jehova agọziwo ndi-Ya; ma nke fọduru bu ọtutu ihe nile a.


O mere ihe ọ nwere ike ime: o buru uzọ te arum manu-otite ka ewe doziem n'olìlì.


Onye kwesiri ka atukwasi ya obi n'ihe dikarisiri ntà kwesi-kwa-ra ka atukwasi ya obi n'oké ihe: onye bu kwa onye ajọ omume n'ihe dikarisiri ntà bu kwa onye ajọ omume n'oké ihe.


Ma n'ubọchi mbu nke ízù ubọchi asa, n'oké isi-ututu, ha biaruru ílì ahu, nēbute uda utọ di iche iche nke ha doziri.


Ya mere mb͕e o ruru anyasi, n'ubọchi ahu, bú ubọchi mbu n'ízù, mb͕e emechi-kwa-ra uzọ nile ebe ndi nēso uzọ-Ya nọ, n'ihi egwu ndi-Ju, Jisus biara guzo n'etiti, si ha, Udo diri unu.


Mb͕e ubọchi asatọ ọzọ gasiri ndi nēso uzọ Jisus we nọ nime ulo, Tomas nọ kwa n'etiti ha. Jisus bia, mb͕e emechiri uzọ nile, O guzo n'etiti ha, si, Udo diri unu.


N'ubọchi mbu n'ízù ubọchi asa, mb͕e ayi zukọrọ inyawa achicha, Pọl we gwa ha okwu, ebe ọ gaje ila echi-ya; o we kwugide okwu rue etiti abali.


Na nka ka m'nēnye kwa ìzùm: n'ihi na nka nābara unu urù, madu ndi buru uzọ malite n'arọ gara aga, ọ bughi nání ime eme, kama ichọ kwa achọ.


Ma i gēcheta Jehova, bú Chineke-gi, n'ihi na Ya onwe-ya bu onye nēnye gi ike imeta àkù; ka Ọ we me ka ọb͕ub͕a-ndu-Ya guzosie ike, nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi imere ha, otú ọ di ta.


Emere ka m'nọ nime Mọ Nsọ n'ubọchi Onye-nwe-ayi, m'we nu otù oké olu n'azum, dika nke opì,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan