Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 15:47 - Bible Nso

47 Madu mbu sitere n'ala, eji-kwa-ra ájá kpu ya: Madu nke-abua sitere n'elu-igwe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

47 Mmadụ nke nwoke sitere nʼala, ejikwa aja kpụọ ya; mmadụ nke abụọ si nʼeluigwe bịa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 15:47
16 Iomraidhean Croise  

Jehova, bú Chineke, we were ájá sitere n'ala kpuọ madu, O we kuo ume ndu nye n'oghere-imi-ya abua; madu ahu we ghọ nkpuru-obi di ndu.


n'ọsusọ iru-gi ka i gēri nri, rue mb͕e i gālata n'ala; n'ihi na esiri na ya weputa gi; n'ihi na ájá ka i bu, ọ bu kwa ájá ka i gālata.


N'ihi na amuworo ayi otù nwa, otù nwa-nwoke ka enyeworo ayi; ibu-onye-isi gādikwasi kwa n'ubu-ya: agākpọ kwa aha-ya Onye-ebube, Onye-ndum-ọdu, Chineke Nke bu Dike, Nna Nke bu Nna mb͕e nile ebighi-ebi, Onye-isi Udo.


N'ubọchi-ya ka agāzọputa Juda, Israel gēbi kwa na ntukwasi-obi: nka bu kwa aha-ya agākpọ ya, Jehova bu ezi omume-ayi.


Le, nwa-ab͕ọghọ ahu nāmaghi nwoke gādi ime, ọ gāmuta kwa Nwa-nwoke, Ha gākpọ kwa aha-Ya Immanuel; nke bu, ma asugharia ya, Chineke nọyere ayi.


n'ihi na ta n'obodo Devid ka amuru nye unu Onye-nzọputa, Nke bu Kraist Onye-nwe-ayi.


Onye si n'elu bia ka ihe nile elu: onye si n'ala puta nāputa n'ala, si kwa n'ala nēkwu okwu: Onye si n'elu-igwe bia ka ihe nile elu.


N'ihi na nri nke Chineke bu nke ahu nke nēsi n'elu-igwe aridata, nke nēnye kwa uwa ndu.


Okwu nke O zitere umu Israel, nēzisa ozi ọma nke udo site n'ọnu Jisus Kraist (Onye ahu bu Onye-nwe madu nile)


Otú a ka edewo-kwa-ra ya n'akwukwọ, si, Madu mbu, bú Adam, ghọrọ nkpuru-obi di ndu. Adam ikpe-azu ghọrọ mọ nke nēnye ndu.


Otú ọ di, nke Mọ nāchi ebughi uzọ, kama ọ bu nke nkpuru-obi nāchi; emesia nke Mọ nāchi soro.


N'ihi na ayi matara na asi na akwaturu ulo nke uwa, bú ulo-ikwū-ayi, ayi nwere ulo ewuru nke sitere na Chineke, ulo anējighi aka wu, di ebighi-ebi, n'elu-igwe.


Ọ bu kwa ihe anēkwuputa na ọ di uku, bú ihe-omimi nke nsọpuru-Chineke; Onye ahu Nke emere ka Ọ puta ìhè n'anu-aru, Nke aguru Ya n'onye ezi omume nime mọ, Nke emere ka ndi-mọ-ozi hu Ya anya, Nke ekwusara Ya n'etiti ndi mba ọzọ, Nke ekwere na Ya nime uwa, Nke anara Ya n'elu nime ebube.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan