Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 15:34 - Bible Nso

34 Sinu n'ura manya teta n'uzọ ezi omume, unu emehie-kwa-la; n'ihi na ufọdu nēnwe amaghi-ihe bayere Chineke: anamekwu nka ka m'me unu ihere n'iru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

34 Sitenụ na ndụ enweghị nghọta unu lọghachita dịka unu kwesiri, unu emehiekwala ọzọ. Nʼihi na-enwere ụfọdụ bụ ndị na-amaghị Chineke. Ana m ekwu nke a ka ihere mee unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 15:34
17 Iomraidhean Croise  

N'obim ka m'zobeworo okwu-ọnu-Gi, Ka m'we ghara imehie megide Gi.


Manu jijiji, emehie-kwa-la: Sinu otú a n'obi-unu n'elu ihe-ndina-unu, we dere du. Selah


Ha we kwe ire-ha, dika uta-ha, ib͕a okwu-ugha dika àkú; ma ọ bughi n'ebe ikwesi-ntukwasi-obi di ka ha diworo ike n'ala: n'ihi na ha esiwo n'ihe ọjọ pukuru ihe ọjọ, ma Mu ka ha nāmaghi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Tetanu, unu ndi nāṅubiga manya ókè, kwanu ákwá; kwasi-kwa-nu ákwá ike, unu nile ndi nāṅu manya-vine, n'ihi manya utọ; n'ihi na ebipuwo ya n'ọnu-unu.


Onye-isi nke ndi-ọ̀kà-ub͕ọ we biakute ya nso, si ya, Gini nēme gi, gi onye oké ura? bilie, kpọkue Chineke-gi, eleghi anya Chineke gēcheta ayi, ayi we ghara ila n'iyì.


Ma Jisus zara, si ha, Unu nēhie uzọ, ebe unu amataghi ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ma-ọbu ike Chineke.


Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus chọputara ya n'ulo uku Chineke, si ya, Le, emewo ka aru di gi nma: emehiela ọzọ, ka ihe jọkariri njọ ghara ime gi.


O we si, Ọ dighi onye ọ bula, Onye-nwe-ayi. Jisus we si, Mu onwem amaghi kwa gi ikpé: ga nke gi. site n'ub͕u a adila nēmehie ọzọ.


Gini mere anātule ya n'ihe anāgaghi-ekwe n'etiti unu, ma ọ buru na Chineke nēme ka ndi nwuru anwu si n'onwu bilie?


Dika ha juru inọgide n'imazu Chineke, Chineke ra-kwa-ra ha nye n'aka uche ajuru aju, ime ihe ahu nile nēkwesighi;


Nke ahu kwa, ebe unu matara oge a, na oge hour eruwo ub͕u a ka unu teta n'ura: n'ihi na ub͕u a nzọputa-ayi di nso kari mb͕e ayi kwere na mbu.


Edeghi m ihe ndia n'akwukwọ dika anameme unu ihe-ihere n'iru, kama dika anamadu unu ọdú, dika umum m'huru n'anya.


Anamekwu nka ka m'me unu ihe-ihere n'iru. Ọ̀ di otú a, na ọ dighi otù onye mara ihe nọ n'etiti unu, onye gāpu ikpe ikpé n'etiti nwa-nna-ya na ibe-ya,


Otú ọ di ọ bughi nime madu nile ka ọmuma-ihe ahu di: kama ufọdu, ebe arusi bu ihe anēme n'ala-ha rue ub͕u a, ha nēri ihe ahu dika ihe achuru n'àjà nye arusi; anēmeru kwa akọ-na-uche-ha, ebe ọ nādighi ike.


N'ihi nka Ọ si, Teta, gi onye nāraru ura, Si kwa na ndi nwuru anwu bilie, Kraist ahu gāmukwasi kwa gi.


ọ bughi n'ọchichọ ọjọ nke agu ihe ọjọ, ọbuná dika ndi mba ọzọ ndi nāmataghi Chineke;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan