O lodawo ọnwu rue mb͕e ebighi-ebi; Onye-nwe-ayi Jehova gēhichapu kwa anya-miri n'iru nile; ita-uta nke ndi-Ya ka Ọ gēwezuga kwa n'elu uwa nile: n'ihi na Jehova ekwuwo ya.
N'aka ala-mọ ka M'gēsi b͕aputa ha; n'aka ọnwu ka M'gēme ka ha si pua nwere onwe-ha: òle ebe ajọ ọria-gi nile nke nēfe efe di, gi ọnwu? òle ebe nbipu-gi di, gi ala-mọ? agēzonari anyam abua nchèghari.
ma emere ka ọ puta ìhè ub͕u a site na ngosi nke Onye-nzọputa-ayi Kraist Jisus, Onye mere ka ọnwu ghara idi ìrè, site kwa n'ozi ọma Ya weputa ndu na emebighi-emebi n'ìhè,
Ya mere ebe umu-ntakiri ahu bu ndi nēnwekọ anu-aru na ọbara, Ya onwe-ya n'otù uzọ ahu keta-kwa-ra ihe ndia; ka O we site n'ọnwu me ka onye ahu ghara idi irè, bú onye nwere ike nke ọnwu, ya bu ekwensu;
Oké osimiri we nyeghachi ndi nwuru anwu di nime ya; ọnwu na Hedis nyeghachi-kwa-ra ndi nwuru anwu di nime ha: ewe kpe ha ikpé n'otù n'otù dika ọlu nile ha si di.
Ọ gēhichapu kwa anya-miri nile ọ bula n'anya-ha; ọnwu agaghi-adi kwa ọzọ; iru-újú ma-ọbu ikwa-ákwá ma-ọbu aru-ufu agaghi-adi kwa ọzọ: ihe ngbu nile agabigawo.