Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 15:10 - Bible Nso

10 Ma site n'amara Chineke abum ihe m'bu: ahu-kwa-ra na amara-Ya nke enyerem abughi ihe-efu; kama adọb͕ubigaram onwem ókè n'ọlu kari ha nile: ma ọ bughi mu onwem, kama amara Chineke nke sorom.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ma site nʼamara nke Chineke, abụ m ihe m bụ. Ọ pụtakwara na amara ya nʼebe m nọ abụghị ihe efu. Kama arụsịrị m ọrụ ike karịchasịa ndị ozi niile. Ma nʼezie, ọ bụghị m na-arụ ọrụ a, kama ọ bụ Chineke nʼonwe ya na-arụ ọrụ ya nʼime m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 15:10
25 Iomraidhean Croise  

N'ihi na ọ bughi unu onwe-unu nēkwu, kama ọ bu Mọ nke Nna-unu Nke nēkwu nime unu.


Ngwa ngwa onye nara talent ise ahu gara were ha zua ahia, we rita urù talent ise ọzọ.


Ya mere asim, Ọ̀ gābu na Chineke nupuru ndi nke Ya? Chineke ekwela. N'ihi na mu onwem bu kwa onye Israel, si na nkpuru Abraham puta, si kwa n'ebo Benjamin puta.


N'ihi na esiterem n'amara nke enyerem si onye ọ bula nọ n'etiti unu, ka ọ ghara itukwasi uche n'onwe-ya kari nke o kwesiri itukwasi uche; kama itukwasi uche n'inwe uche zuru okè, dika Chineke kère ọtùtù nke okwukwe nye madu nile n'otù n'otù.


Ya mere ma ọ buru mu onwem, ma-ọbu ndi ahu, otú a ka ayi nēkwusa, otú a ka unu kwe-kwa-ra.


nke esite-kwa-ra zọputa unu, ma ọ buru na unu jidesie ya ike, bú aha okwu m'ji zì unu ozi ọma ahu, ma asi na ọ bughi na unu kwere n'efu.


Dika amara Chineke nke enyerem si di, dika onye-isi-ọ̀kà nke mara ihe, atọrọm ntọ-ala; onye ọzọ nēwu kwa ulo n'elu ya. Ma ka onye ọ bula lezi anya otú ọ nēwu ulo n'elu ya.


Mu onwem kuru osisi, Apọlos kwọsara ya miri; ma ọ bu Chineke nēme ka ọ nāba uba.


N'ihi na Ònye nākpa ókè n'etiti gi na madu-ibe-gi? ọ̀ bu gini kwa ka i nwere nke i nānataghi? ma ọ buru na i natara ya, gini mere i nānya isi, dika agāsi na i nataghi ya?


Aghọwom onye nēnweghi uche: unu onwe-unu rugiderem; n'ihi na ugwọ unu ji mu onwem bu ime ka amaram: n'ihi na ọ dighi uzọ ọ bula m'nērughi ndi kachasi elu n'etiti ndi-ozi, asi na ọ bu ezie na abughi m ihe ọ bula.


ọ bughi na ayi ruru n'onwe-ayi, igu ihe ọ bula dika o sitere n'onwe-ayi; kama iru-eru-ayi sitere na Chineke;


Ma, dika ndi ayi na Ya nālukọ ọlu, ayi nāriọ kwa unu ka unu ghara inara amara Chineke n'efu,


(n'ihi na Onye lusiri Pita ọlu ike ka ọ we lua ọlu onye-ozi nke ndi obibì-úgwù, Onye ahu lusikwara m ọlu ike ka m'we jekuru ndi mba ọzọ);


n'ihi na ọ bu Chineke Onye nālusi ọlu ike nime unu ichọ-achọ-unu na ilusi-ọlu-ike-unu, n'ihi na ọ di Ya ezi nma.


Enwerem ike n'ihe nile nime Onye ahu Nke nēmem ka m'di ike.


Ma ayi nēkpere unu, umu-nna-ayi, ka unu mata ndi nādọb͕u onwe-ha n'ọlu n'etiti unu, ndi bu kwa ndi-isi-unu nime Onye-nwe-ayi, ndi nādu kwa unu ọdú;


N'ihi na ọ bu iru nka ka ayi nādọb͕u onwe-ayi n'ọlu, nāb͕asi kwa nb͕a ike, n'ihi na ayi elewo anya Chineke di ndu, Onye bu Onye-nzọputa madu nile, ma nke kachasinu Onye nzọputa nke ndi kwere ekwe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan