Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 14:4 - Bible Nso

4 Onye ji asusu di iche nēkwu okwu nēwuli onwe-ya elu dika ulo; ma onye nēbu amuma nēwuli nzukọ Kraist elu dika ulo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ya mere, onye ahụ na-ebu amụma na-enyere chọọchị aka, ma onye ahụ na-asụ asụsụ ọzọ, na-enyere naanị onwe ya aka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 14:4
12 Iomraidhean Croise  

Ihe-iriba-ama ndia gēso kwa ndi kwere: n'aham ka ha gāchupu ndi-mọ ọjọ; ha gēkwu okwu n'asusu ọhu di iche iche;


Ya mere otú a, ka ayi nāb͕aso ihe nile diri udo, na ihe nile diri iwulirita onwe-ayi elu dika ulo.


nye kwa onye ọzọ nluputa nke ọlu di ike; nye kwa onye ọzọ obubu-amuma; nye kwa onye ọzọ itule mọ di iche iche; nye kwa ibe-ya aha asusu di iche iche; nye kwa onye ọzọ isughari asusu:


Chineke debe-kwa-ra ufọdu nime nzukọ-Ya, nke-mbu ndi-ozi, nke-abua ndi-amuma, nke-atọ ndi-ozizí, nke so ha ọlu di ike, nke so ha onyinye-amara di iche iche ime ka aru madu di ike, iye-aka, ichi-isi, aha asusu di iche iche.


Asi na ejim asusu di iche iche nke madu na nke ndi-mọ-ozi nēkwu okwu, ma enweghi m ihu-n'anya, aghọwom ọla nāra ara, ma-ọbu ájà ọla nāda udà.


Asi kwa na enwerem onyinye ibu-amuma, mata kwa ihe-omimi nile na ihe-ọmuma nile; asi kwa na enwerem okwukwe nile, nke mere m'gēnwe ike ibubiga ugwu, ma enweghi m ihu-n'anya, abughm ihe ọ bula.


Otú a unu onwe-unu kwa, ebe unu bu ndi nēwere obi nānu ọku chọ onyinye nile nke Mọ Nsọ, nāchọnu ka unu we babiga ókè nime ha, ka ewe wuli nzukọ Kraist elu dika ulo.


Ya mere asusu di iche iche ndia, emere ka ha buru ihe-iriba-ama, ọ bughi nye ndi kwere ekwe, kama nye ndi nēkweghi ekwe: ma emere ibu-amuma ka ọ buru ihe-iriba-ama, ọ bughi nye ndi nēkweghi ekwe, kama nye ndi kwere ekwe.


Ọ̀ bu gini kwa, umu-nnam? mb͕e ọ bula unu biakọrọ n'otù ebe, unu nile n'otù n'otù ji abù ọma, ji ihe-ozizí, ji ihe-nkpughe, ji asusu di iche, ji isughari-asusu. Ka eme ihe nile ka ewe wuli madu nile elu dika ulo.


Ma onye nēbu amuma nāgwa madu okwu nke iwuli-elu dika ulo, na nke nkasi-obi, na nke ngugu-obi.


Otú ọ di, anamachọ ka unu nile ji asusu di iche iche nēkwu okwu, ma achọkaririm ka unu nēbu amuma: onye nēbu amuma ka kwa onye ji asusu di iche iche nēkwu okwu, ma-ọbughi na ọ nāsughari ya, ka ewe wuli nzukọ Kraist elu dika ulo.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan