Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 14:25 - Bible Nso

25 ihe-nzuzo nile nke obi-ya aputa ìhè; ọ gēsi otú a da kpuchie iru-ya n'ala kpọ kwa isi ala nye Chineke, nēkwuputa na ọ bu ezie na Chineke nọ n'etiti unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 Mgbe a na-eme ka ihe nzuzo nke obi ha niile pụta ìhè, onye dị otu a ga-egbu ikpere nʼala kpọọ isiala nye Chineke sị, “Nʼezie, Chineke nọ nʼetiti unu.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 14:25
15 Iomraidhean Croise  

Juda na umu-nne-ya we ba n'ulo Josef; ma ya onwe-ya nọ kwa n'ebe ahu rue mb͕e ahu: ha we da n'ala n'iru ya.


E, eze nile gākpọ isi ala nye ya: Mba nile gēfè ya òfùfè.


Otú a ka Jehova siri, Ihe putara na ndọb͕u Ijipt nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, na ọzuzu-ahia nke Etiopia, na ndi Saba, ndi toro ogologo, gāgabigakute gi, ndi i nwere ka ha gābu kwa; gi ka ha gēso n'azu; na nkpọrọ ka ha gāgabiga: ọ bu kwa gi ka ha gākpọ isi ala nye, gi ka ha gēkpere, si, N'ezie nime gi ka Chineke nọ; ọ dighi kwa onye ọzọ di, ọ dighi otù Chineke efu di ma-ọli.


Ọzọ, umu nke ndi nēweda gi n'ala gējekuru gi nēruda n'ala; ndi nile nke nēlelì gi anya gākpọ kwa isi ala n'ọbu-ukwu nke ukwu-gi abua; ha gākpọ kwa gi, Obodo Jehova, Zaion nke Onye Nsọ nke Israel.


Eze zara Daniel, si, N'ezi-okwu Chineke-unu bu Chineke nke chi nile, na Onye-nwe ndi-eze, na Onye nēkpughe ihe-nzuzo nile, ebe i puru ikpughe ihe-nzuzo a.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Na mb͕e ahu ka ndikom iri gēsi n'asusu nile nke mba nile jide, ọbuná ijide ọnu-ọnu-ala uwe nwoke bu onye-Ju, si, Ayi na unu gāyikọ je, n'ihi na ayi anuwo na Chineke nọyere unu.


o we da kpuchie iru-ya n'ala n'ukwu-Ya, nēkele Ya: onye ahu bu kwa onye Sameria.


Ma mb͕e Saimon Pita huru ya, o we da n'ala n'ikperè Jisus, si, Si n'ebe m'nọ pua; n'ihi na abum onye-nmehie, Onye-nwe-ayi.


Ma mb͕e ọ huru Jisus, o tisie nkpu ike, da kwa n'ala n'iru Ya, were oké olu si, Gini ka mu na Gi nwekọrọ, Jisus, Ọkpara Chineke Nke kachasi ihe nile elu? ariọm Gi, emekpalam aru.


Nwanyi ahu si Ya, Onye-nwe-ayi, ahurum na Gi onwe-gi bu onye-amuma.


Ma mb͕e ha huru nkwuwa-okwu nke Pita na Jọn, mb͕e ha ghọta-kwa-ra na ha bu ndi nāmaghi ihe na ndi nāmutaghi akwukwọ ri nne, o ju ha anya; ha we mata ha, na ha na Jisus anọwori.


M'we turu onwem n'ala n'iru Jehova, dika na mbu, ọgu ubọchi abua ehihie na abali; ọ dighi nri m'riri, ọ dighi kwa miri m'ṅuru; n'ihi nmehie-unu nile nke unu mehiere, n'ime ihe ọjọ ahu n'anya Jehova, ikpasu Ya iwe.


Orú ndi-okenye na anọ ahu na ihe anọ ahu nke di ndu we da n'ala, kpọ isi ala nye Chineke, bú Onye nānọkwasi n'oche-eze ahu, si, Amen; Haleluya.


Mb͕e Ọ natara akwukwọ ahu, ihe anọ ahu nke di ndu na orú ndi-okenye na anọ ahu we da n'ala n'iru Nwa-aturu ahu, ha nile n'otù n'otù nwere ubọ-akwara, na ọkwa nke eji ọla-edo me nke juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nke bu ekpere ndi nsọ.


Samuel we za Sọl, si, Mu onwem bu onye-ọhu-uzọ ahu; rigorue ebe di elu n'irum, unu gēsokwam ri ihe ta: m'gēzilaga kwa gi n'ututu, ihe nile nke di n'obi-gi ka m'gēgosi kwa gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan