Ọtutu ihe ka Gi onwe-gi meworo, Jehova, bú Chinekem, bú oké ọlu-Gi nile, Na èchìchè-Gi nile n'ebe ayi nọ: Apughi idoro Gi ha n'usoro; Asi na agamegosi kwu kwa okwu bayere ha, Ha kariri igu-ọnu.
Ònye rigoworo n'elu-igwe, we rida? Ònye chikọtaworo ifufe nime nkwukwuba-aka-Ya abua? Ònye kegideworo miri n'uwe-Ya? Ònye meworo ka nsọtu nile nke uwa guzosie ike? Gini bu aha-Ya, gini bu kwa aha nwa-Ya, ma asi na i mara?
Nnam rara ihe nile nyem n'aka: ọ dighi kwa onye ọ bula mazuru Ọkpara ahu, ma-ọbughi Nna-Ya; ọ dighi kwa onye mazuru Nna ahu, ma-ọbughi Ọkpara-Ya, na onye ọ bula Ọkpara nēzube ikpughe Ya nye ya.
kama dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ihe anya nāhughi, nke nti nānughi kwa, Nke nābàghi kwa n'obi madu, Ka ha ra, bú ihe Chineke doziri ndi huru Ya n'anya.
Ọ bu mu onwem, bú onye di ntà kari onye dikarisiri ntà n'etiti ndi nsọ nile, ka enyere amara nka, izisara ndi mba ọzọ ozi ọma nke àkù nke Kraist nke anēnweghi ike ituputa ya;
Ndi m'huru n'anya, ub͕u a ka ayi bu umu Chineke, akēmeghi kwa ka ọ puta ìhè ihe ayi gābu. Ayi matara na, ọ buru na agēme ka Ọ puta ìhè, ayi gābu ndi yiri Ya; n'ihi na ayi gāhu Ya otú Ọ di.