Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 13:9 - Bible Nso

9 N'ihi na ayi mara na nkpirikpi, ayi nēbu kwa amuma na nkpirikpi:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Nʼihi na ọmụma anyị ezughị oke, ibu amụma anyị ezukwaghị oke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 13:9
16 Iomraidhean Croise  

Le, ndia bu nání nsọtu uzọ-Ya nile: Le kwa otú ọ di ntà, bú ntakwu okwu anuworo bayere Ya! Ma éb͕è-elu-igwe nke idi-ike-Ya nile, ònye gāghọta ya?


Ọmuma-ihe di otú a dikaririm ebube; Ọ dika elu, apughm iru ya.


Ọtutu ihe ka Gi onwe-gi meworo, Jehova, bú Chinekem, bú oké ọlu-Gi nile, Na èchìchè-Gi nile n'ebe ayi nọ: Apughi idoro Gi ha n'usoro; Asi na agamegosi kwu kwa okwu bayere ha, Ha kariri igu-ọnu.


Ònye rigoworo n'elu-igwe, we rida? Ònye chikọtaworo ifufe nime nkwukwuba-aka-Ya abua? Ònye kegideworo miri n'uwe-Ya? Ònye meworo ka nsọtu nile nke uwa guzosie ike? Gini bu aha-Ya, gini bu kwa aha nwa-Ya, ma asi na i mara?


Nnam rara ihe nile nyem n'aka: ọ dighi kwa onye ọ bula mazuru Ọkpara ahu, ma-ọbughi Nna-Ya; ọ dighi kwa onye mazuru Nna ahu, ma-ọbughi Ọkpara-Ya, na onye ọ bula Ọkpara nēzube ikpughe Ya nye ya.


N'ihi na ònye mara uche Onye-nwe-ayi? ma-ọbu ònye putara ibu onye Ya na ya nāb͕a izù?


ma mb͕e ọ bula ihe nke zuru okè gābia, agēme ihe, nke di na nkpirikpi ka ọ ghara idi irè.


N'ihi na ub͕u a ayi ji enyo hu ihe, nime ilu; ma mb͕e ahu ayi gāhu iru na iru: ub͕u a m'mara na nkpirikpi; ma mb͕e ahu m'gāmazu dika amazu-kwa-ram.


kama dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ihe anya nāhughi, nke nti nānughi kwa, Nke nābàghi kwa n'obi madu, Ka ha ra, bú ihe Chineke doziri ndi huru Ya n'anya.


Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya mara ihe ọ bula, ọ kāmaghi dika ọ nāghaghi ima;


Ọ bu mu onwem, bú onye di ntà kari onye dikarisiri ntà n'etiti ndi nsọ nile, ka enyere amara nka, izisara ndi mba ọzọ ozi ọma nke àkù nke Kraist nke anēnweghi ike ituputa ya;


Ndi m'huru n'anya, ub͕u a ka ayi bu umu Chineke, akēmeghi kwa ka ọ puta ìhè ihe ayi gābu. Ayi matara na, ọ buru na agēme ka Ọ puta ìhè, ayi gābu ndi yiri Ya; n'ihi na ayi gāhu Ya otú Ọ di.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan