Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 13:1 - Bible Nso

1 Asi na ejim asusu di iche iche nke madu na nke ndi-mọ-ozi nēkwu okwu, ma enweghi m ihu-n'anya, aghọwom ọla nāra ara, ma-ọbu ájà ọla nāda udà.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 A sị na m na-asụ asụsụ dị iche iche nke ndị mmadụ maọbụ nke ndị mmụọ ozi, ma ahụghị m mmadụ ibe m nʼanya, abụ m naanị ogene na-eme ụzụ maọbụ mbadamba efere na-ada ụda.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 13:1
22 Iomraidhean Croise  

Chirinu ájà nke anānu nke-ọma to Ya: Chirinu ájà nke nādasi udà ike to Ya.


Mb͕e ahu Ọ gāza ha, si, N'ezie asim unu, Ka ọ ra, bú otú unu nēmeghi ya nye otù onye nime ndia dikarisiri ntà, Mu ka unu nēmeghi ya nye.


Ihe-iriba-ama ndia gēso kwa ndi kwere: n'aham ka ha gāchupu ndi-mọ ọjọ; ha gēkwu okwu n'asusu ọhu di iche iche;


N'ihi na asi na n'ihi ihe-oriri ọ nēwuta nwa-nna-gi, i dighi-ejeghari ọzọ dika ihu-n'anya si di. Ewela ihe-oriri-gi la onye ahu n'iyì, bú onye Kraist nwuru n'ihi ya.


nye kwa onye ọzọ nluputa nke ọlu di ike; nye kwa onye ọzọ obubu-amuma; nye kwa onye ọzọ itule mọ di iche iche; nye kwa ibe-ya aha asusu di iche iche; nye kwa onye ọzọ isughari asusu:


Ọ buru kwa na nti gāsi, N'ihi na abughi m anya, abughi m nke aru; ọ bughi ihe nābughi nke aru n'ihi nka.


N'ihi na anēsite n'aka Mọ Nsọ nye otù onye okwu amam-ihe; anēnye kwa onye ọzọ okwu ọmuma, di ka Mọ ahu nāchọ:


Ihu-n'anya adighi-ada mb͕e ọ bula: ma ọ buru na ibu-amuma di, agēme ka ha ghara idi irè; ọ buru kwa na asusu di iche iche di, ha gāgwu; ọ buru kwa na ihe-ọmuma di, agēme ka ọ ghara idi irè.


N'ihi na onye ji asusu di iche nēkwu okwu, ọ dighi-agwa madu okwu, kama ọ nāgwa Chineke; n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nānu ihe ọ nēkwu; ma o ji mọ-ya nēkwu ihe-omimi.


Onye ji asusu di iche nēkwu okwu nēwuli onwe-ya elu dika ulo; ma onye nēbu amuma nēwuli nzukọ Kraist elu dika ulo.


Otú ọ di, anamachọ ka unu nile ji asusu di iche iche nēkwu okwu, ma achọkaririm ka unu nēbu amuma: onye nēbu amuma ka kwa onye ji asusu di iche iche nēkwu okwu, ma-ọbughi na ọ nāsughari ya, ka ewe wuli nzukọ Kraist elu dika ulo.


Ma okwu bayere ihe achuru n'àjà nye arusi: Ayi matara na ayi nile nwere ọmuma-ihe. Ọmuma-ihe nāfuli elu, ma ihu-n'anya nēwuli elu dika ulo.


na eweliri ya rigo na Paradais na mberede, o we nu okwu nke anāpughi ikwu, nke o nēzighi ezi n'iwu ka madu kwue ha.


Ma nkpuru nke Mọ Nsọ bu ihu-n'anya, ọṅù, udo, ogologo-ntachi-obi; obi-ọma, idi-nma, ikwesi-ntukwasi-obi,


N'ihi na nime Kraist Jisus ọ dighi ike ọ bula obibì-úgwù ma-ọbu ebìghi-úgwù nwere; kama nke nwere ike bu okwukwe nke sitere n'aka ihu-n'anya alusi ọlu ike.


Ma ihe ezubere iweta n'iwu ahu bu ihu-n'anya sitere n'obi ọcha na ezi akọ-na-uche na okwukwe nke iru-abua nādighi ya:


nke bu isi ihe nile menu ka ihu-n'anya ahu unu nāhurita onwe-unu di ike; n'ihi na ihu-n'anya nēkpuchi ọtutu nmehie:


N'ihi na, ebe ha nēkwu oké okwu na mbuli elu nke ihe-efu, ha were agu ikwa-iko di iche iche nārafu ndi ahu nime agu ihe ọjọ nke anu-aru, bú ndi nāb͕anari n'oge ub͕u a ndi nēbi obi na njehie;


M'we nu olu ka ọ nēsi n'elu-igwe dà, dika olu ọtutu miri, di kwa ka olu oke éb͕è-elu-igwe: olu ahu m'nuru di kwa ka olu ndi nākpọ ubọ-akwara mb͕e ha nēwere ubọ-akwara-ha nākpọ:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan