Chineke debe-kwa-ra ufọdu nime nzukọ-Ya, nke-mbu ndi-ozi, nke-abua ndi-amuma, nke-atọ ndi-ozizí, nke so ha ọlu di ike, nke so ha onyinye-amara di iche iche ime ka aru madu di ike, iye-aka, ichi-isi, aha asusu di iche iche.
Ma anamachọ ka madu nile di ka mu onwem di kwa. Otú ọ di, madu nile n'otù n'otù nwere onyinye-amara nke aka ha site na Chineke, otù onye otú a, onye ọzọ otú a kwa.
Ya onwe-ya nye-kwa-ra ufọdu ka ha buru ndi-ozi; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi-amuma; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi nēzisa ozi ọma; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi nāzù aturu Chineke na ndi-ozizí;
Chineke nēso kwa ha nāb͕akọ àmà, site n'ihe-iriba-ama na ọlu-ebube di iche iche, site kwa n'ọlu ike di iche iche, site kwa n'òkìkè nke Mọ Nsọ, dika ọchichọ nke aka Ya si di.
dika unu nile n'otù n'otù natara onyinye-amara, werenu ihe ahu nējerita onwe-unu ozi, dika ndi nāchi èzi-na-ulo nke-ọma n'amara Chineke nke di n'uzọ di iche iche;