14 N'ihi na aru-ayi abughi nání otù ihe nke di ya nime, kama ọ bu ọtutu ihe.
14 Ahụ mmadụ abụghị naanị otu akụkụ, kama o nwere ọtụtụ akụkụ ahụ.
N'ihí na dika aru-ayi bu otù, nwe kwa ọtutu ihe di ya nime, ma ihe nile nke di n'aru, ọ bu ezie na ha di ọtutu, ma ha bu otù aru; otú a ka Kraist di kwa.
Ọ buru na ukwu gāsi, N'ihi na abughi m aka, abughi m nke aru; ọ bughi ihe nābughi nke aru n'ihi nka.
Ma asi na ha nile bu otù ihe di n'aru, òle ebe ka aru di?
Ma otú ọ di, ha di ọtutu ihe di n'aru, ma ha bu otù aru.
N'ihi nka, ebe unu tupuru okwu-ugha, nēkwunu ezi-okwu onye ọ bula n'ebe onye-ab͕ata-obi-ya nọ: n'ihi na ayi nāburita ihe di n'aru ibe-ayi.