Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 12:11 - Bible Nso

11 ma ihe ndia nile ka otù Mọ ahu nālusi ike, nání Ya, nēkère madu nile n'otù n'otù, ebe onye ọ bula nọ O kère ya dika Ọ nāchọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ọ bụ otu Mmụọ ahụ na-enye onyinye ndị a niile. Ọ na-enye onye ọbụla onyinye dị iche iche dịka Mmụọ Nsọ si kpebie.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 12:11
18 Iomraidhean Croise  

ọ bu kwa ndi nile bi n'uwa ka anāgu n'ihe-efu: ọ bu kwa dika O si achọ ka Ọ nēme n'usu-ndi-agha nke elu-igwe, na n'etiti ndi bi n'uwa: ọ dighi kwa onye gēti aka-Ya ihe, si Ya, Gini ka I meworo?


e, Nna, ekelem I na ọ di ezi nma otú a n'iru Gi.


Ò zighi ezi n'iwu ka m'were ihe nile nkem me ihe m'nāchọ? ma-ọbu ànya-gi jọrọ njọ, n'ihi na mu onwem bu ezi madu?


Jọn zara, si, Madu apughi inata ihe ọ bula, ọ buru na eweghi ya nye ya site n'elu-igwe.


Ifufe nēfe ebe ọ nāchọ, i nānu kwa olu-ya, ma i mataghi ebe o si bia, na ebe ọ nāga: otú a ka onye ọ bula amuworo site na Mọ Nsọ di.


N'ihi na dika Nnam nēme ndi nwuru anwu ka ha si n'ọnwu bilie, dika Ọ nēme kwa ka ha di ndu, otú a ka Ọkpara-Ya nēme kwa ka ndi Ọ nāchọ di ndu.


Ma ebe ayi nwere onyinye-amara di iche iche dika amara nke enyere ayi si di, ma ayi nwere ibu-amuma, ka ayi nēbu amuma ka okwukwe-ayi ra;


Ya mere otú a ọ bu onye Ọ nāchọ ka Ọ nēmere ebere, ọ bu kwa onye Ọ nāchọ ka ọ nēme ka o nwe obi-etili.


Ma otú ọ di, Chineke debere ihe di n'aru, ha nile n'otù n'otù, nime aru, dika Ọ chọrọ.


Ma òkìkè nke onyinye-amara di, ma ọ bu otù Mọ Nsọ ahu.


Òkìkè ihe alutaworo n'ọlu di kwa, ma ọ bu otù Chineke ahu, Onye nālusi ihe nile ike nime ayi nile.


Ọ bu nání, dika Onye-nwe-ayi kèworo nye onye ọ bula, dika Chineke kpọworo onye ọ bula, ya jegharia otú a. Otú a ka m'nāka kwa àkà nime nzukọ Kraist nile.


Ma anamachọ ka madu nile di ka mu onwem di kwa. Otú ọ di, madu nile n'otù n'otù nwere onyinye-amara nke aka ha site na Chineke, otù onye otú a, onye ọzọ otú a kwa.


Ma ayi onwe-ayi agaghi-anya isi rue ihe anāpughi itù atù, kama dika ọtùtù nke ihe-ọtùtù ahu si di, bú nke Chineke keputara ayi, dika ọtùtù, ibiaru ọbuná n'ebe unu nọ.


Nke eme-kwa-ra ayi ka ayi buru ihe-nketa nime Ya, ebe eburu uzọ ka ayi àkà dika Onye ahu zubere, Onye nālusi ihe nile ike dika ìzù nke ọchichọ-Ya si di;


Ma ọ bu ayi nile n'otù n'otù ka enyere amara ahu dika ọtùtù nke onyinye Kraist si di.


Chineke nēso kwa ha nāb͕akọ àmà, site n'ihe-iriba-ama na ọlu-ebube di iche iche, site kwa n'ọlu ike di iche iche, site kwa n'òkìkè nke Mọ Nsọ, dika ọchichọ nke aka Ya si di.


N'ihi na O zubere ya O were okwu nke ezi-okwu muputa ayi, ka ayi we buru otù aha nkpurú mbu nke ihe O kère èkè.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan