Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 11:7 - Bible Nso

7 N'ihi na nwoke ekwesighi n'ezie ka ekpudo ya ihe n'isi, ebe ọ bu onyinyo na otuto nke Chineke: ma nwanyi bu otuto nke nwoke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Ma nwoke ekwesighị ikpuchi isi ya, nʼihi na nwoke bụ onyinyo na otuto nke Chineke, ebe nwanyị bụ otuto nke nwoke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 11:7
10 Iomraidhean Croise  

Nwayi ahu ka Ọ siri, M'gēme ka ihe-nb͕u-gi na itu-ime-gi ba uba nke-uku; n'ihe-nb͕u ka i gāmu umu; n'ebe di-gi nọ ka ọchichọ-gi gādi, ya onwe-ya gāchi kwa gi.


Nka bu akwukwọ osuso-ọmumu nile nke Adam. N'ubọchi Chineke kere madu, n'oyiyi Chineke ka O mere ya;


Onye nāwusi ọbara madu, site n'aka madu ka agāwusi ọbara-ya: n'ihi na ọ bu n'onyinyo Chineke ka O mere madu.


I nēme ya ka ọ nāchi ọlu nile nke aka-Gi abua; Ihe nile ka I doro n'okpuru ukwu-ya abua:


Nwanyi nke nējide onwe-ya nke-ọma bu okpu-eze di-ya: Ma ọ di ka ire-ure n'ọkpukpu di-ya, bú nwayi nēweta ihere.


Ma anamachọ ka unu mata na Kraist bu isi nke nwoke ọ bula; nwoke bu kwa isi nke nwanyi; Chineke bu kwa isi nke Kraist.


N'ihi na asi na nwanyi ekpudoghi onwe-ya ihe n'isi, ka akpacha kwa agiri-isi-ya: ma asi na ọ buru nwanyi ihe-ihere ka akpacha agiri-isi-ya ma-ọbu ka akọpu isi-ya, ka ekpudo ya ihe n'isi.


Ma ọ buru na onye ọ bula aju ajuju bayere Taitọs, ọ bu onye mu na ya nēnwekọ ihe, buru kwa onye mu na ya nālukọrọ unu ọlu; ma-ọbu umu-nna-ayi, ha bu ndi-ozi nke nzukọ Kraist, ha bu otuto nke Kraist.


Ọ bu nka ka ayi ji nāgọzi Onye-nwe-ayi, bú Nna-ayi; nka ka ayi ji kwa nābu madu ọnu, ndi ekèworo dika oyiyi Chineke si di:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan