Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 11:4 - Bible Nso

4 Nwoke ọ bula, mb͕e ọ nēkpe ekpere ma-ọbu mb͕e ọ nēbu amuma, ọ buru na o kpu ihe-nkpudo n'isi-ya, ọ nēme ka ihere me isi-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Nwoke ọbụla kpuchiri isi ya mgbe ọ na-ekpe ekpere maọbụ na-ebu amụma na-emenye isi ya ihere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 11:4
11 Iomraidhean Croise  

Ma Devid nārigo na nrigo ugwu Olive, nārigo nākwa ákwá; ekpuchi-kwa-ra isi-ya, ya onwe-ya nēje kwa b͕ara ukwu efu: ndi nile ndi soro ya je kpuchi-kwa-ra, nwoke ọ bula isi-ya, ha we rigo, nārigo nākwa ákwá.


Ma eze kpuchiri iru-ya, eze we tie nkpu n'oké olu, si, Nwam Absalom, Absalom, nwam, nwam!


N'ihi na nwa-nwoke nākpọ nna-ya onye-nzuzu, nwa-nwanyi nēbili imegide nne-ya, nwunye nwa imegide nne di-ya; ndi-iro madu bu ndi ulo-ya.


Ma ndi-amuma na ndi-ozizí di n'Antiọk, nime nzukọ Kraist di n'ebe ahu, bú Banabas, na Simeon onye anākpọ Naiga, na Lusiọs onye Sairini, na Manaen onye azùkọrọ ya na Herod, bú tetrarch, na Sọl.


Ọbuná uzọ ekère madu, yà onwe-ya adighi-ezí unu, na, asi na nwoke nwere ogologo agiri-isi, na ọ buru ya ihe-ihere?


Ma nwanyi ọ bula, mb͕e ọ dighi-ekpudo ihe n'isi-ya n'ikpe ekpere ma-ọbu n'ibu amuma, ọ nēme ka ihere me isi-ya: n'ihi na ya na nwanyi nke akọpuworo isi-ya bu otù ihe ahu.


nye kwa onye ọzọ nluputa nke ọlu di ike; nye kwa onye ọzọ obubu-amuma; nye kwa onye ọzọ itule mọ di iche iche; nye kwa ibe-ya aha asusu di iche iche; nye kwa onye ọzọ isughari asusu:


Chineke debe-kwa-ra ufọdu nime nzukọ-Ya, nke-mbu ndi-ozi, nke-abua ndi-amuma, nke-atọ ndi-ozizí, nke so ha ọlu di ike, nke so ha onyinye-amara di iche iche ime ka aru madu di ike, iye-aka, ichi-isi, aha asusu di iche iche.


Asi kwa na enwerem onyinye ibu-amuma, mata kwa ihe-omimi nile na ihe-ọmuma nile; asi kwa na enwerem okwukwe nile, nke mere m'gēnwe ike ibubiga ugwu, ma enweghi m ihu-n'anya, abughm ihe ọ bula.


unu akpọla ibu-amuma ihe-efu;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan