Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 11:24 - Bible Nso

24 kele kwa, we nyawa ha, si, Nka bu arum, nke anēnye n'ihi unu: nēmenu nka ka unu we nēchetam.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Mgbe o nyechara ekele, ọ nyawara ya sị, “Nke a bụ ahụ m nke a na-enye maka unu. Na-emenụ nke a iji cheta m.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 11:24
20 Iomraidhean Croise  

Ihe-ncheta ka O meworo nye oké ọlu-Ya nile: Onye nēme ebere na Onye nwere obi-ebere ka Jehova bu.


Ndi di ume-ala n'obi gēri ihe, riju kwa afọ: Ha gēto Jehova, bú ndi nāchọ Ya: Ka obi-unu di ndu rue mb͕e ebighi-ebi.


Ndi bara uba nile nke uwa gēri ihe, kpọ kwa isi ala: N'iru Ya ka ndi nile ndi nārida n'ájá gēruru ala, Ha na onye nēdebeghi nkpuru-obi-ya ndu.


Ubọchi a gāburu unu ihe-ncheta, unu gēme kwa ya ka ọ buru ememe unu nēmere Jehova: n'ọb͕ọ nile unu ka unu ganēme ya ka ọ buru ememe site n'ukpuru ebighi-ebi.


I gētiye kwa nkume abua ahu n'elu ubu ephod, iburu umu Israel nkume ncheta: Eron gēbu kwa aha-ha n'iru Jehova n'elu ubu-ya abua, ibu ihe-ncheta.


Bianu, rienu nrim ufọdu, Ṅu-kwa-nu manya-vine ufọdu nke m'gwaworo agwa.


Dọrọm; gi ka ayi gāb͕aso: Eze emewo ka m'ba n'ime-ulo-ya: Ayi gēteghari egwú ọṅù ṅuri kwa nime gi, Ayi gēhota ihu-n'anya-gi nile kari manya-vine: N'izi-ezi nile ka ha huworo gi n'anya.


Abatawom n'ubim ab͕ara ogige, nwa-nnem nwayi, nwunye ọhu nkem: Aghọrọwom myrrh nkem, ya na udam; Arachawom ub͕ub͕ọ-manu-aṅum, ya na manu-aṅum; Aṅuwom manya-vine nkem, ya na miri-ara-ehim. Rienu ihe, ndi-eyim; Ṅuanu ihe-ọṅuṅu, e, ṅujuenu afọ unu ndi ihe-unu nātọm utọ.


Ọ bu kwa n'ugwu a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēmere ndi nile di iche iche oké oriri nke ihe mara abuba, bú oké oriri nke ezi manya-vine doro edo, nke ihe mara abuba juputara n'umi, nke manya-vine doro edo azara nke-ọma.


Ọzọ, n'uzọ nke ikpé-Gi nile, Jehova, ka ayi leworo anya Gi: aha-Gi na ncheta-Gi nāti nkpuru-obi-ayi akpiri.


N'ezie asim unu, Ebe ọ bula agēkwusa ozi ọma nka n'uwa dum, agēkwuta kwa ihe nke nwanyi a mere, ka ọ buru ihe-ncheta-ya.


N'ihi na mu onwem natara n'aka Onye-nwe-ayi ihe m'nye-kwa-ra unu n'aka idebe, na Onye-nwe-ayi Jisus n'abali ahu nke arara Ya nye n'aka madu, Ọ nara ob͕e achicha,


Mb͕e ha risiri nri-anyasi, Ọ nara kwa iko otú ahu, si, Iko a bu ọb͕ub͕a-ndu ọhu nime ọbaram: nēmenu nka, mb͕e ọ bula unu gāṅu ya, ka unu we nēchetam.


unu gāsi kwa ha, N'ihi na ebipuru miri Jọdan n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova; mb͕e ọ gabigara Jọdan, ebipuru miri Jọdan: nkume ndia gābu-kwa-ra umu Israel ihe-ncheta rue mb͕e ebighi-ebi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan