1 Ndị Kọrint 11:22 - Bible Nso22 Ọ̀ gābu na unu enweghi nọ̄ ulo iri ihe na iṅu ihe-ọṅuṅu nime ha? ma-ọbu ùnu nēlelì nzukọ Chineke, me kwa ndi nēnweghi ihe ka ihere me ha? Ọ̀ bu gini ka m'gāsi unu? #m'gēto unu? Etoghi m unu na nka. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a22 A ga-akpọ nke a gịnị? Ọ bụ na unu enweghị ụlọ ebe unu ga-anọ rijuo afọ ma ṅụjuokwa afọ? Ka ọ bụ na unu na-elelị nzukọ Chineke na emenye ndị na-enweghị ihe ihere? Gịnị ka m ga-agwa unu? Aga m eto unu maka nke a? Agaghị m eto unu maka nke a. Faic an caibideil |