Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 11:19 - Bible Nso

19 N'ihi na irọ-òtù di iche iche aghaghi idi kwa n'etiti unu, ka ndi anwaputaworo we ghọ ndi putara ìhè n'etiti unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Nʼezie ụdị nkewa dị otu a aghaghị ịdị nʼetiti unu ka e nwee ike mara ndị Chineke nabatara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 11:19
19 Iomraidhean Croise  

Ahuhu gādiri uwa site n'ihe di iche iche nēme ka madu ma n'ọnyà; n'ihi na ọ di nkpà na ihe ahu nēme ka madu ma n'ọnyà gābia; ma ahuhu gādiri madu ahu onye ihe ahu nēme ka madu ma n'ọnyà nēsite n'aka-ya bia.


O we si ndi nēso uzọ-Ya, Ọ bu ihe nāghaghi ime na ihe di ìche iche nēme ka madu ma n'ọnyà gābia: ma ahuhu gādiri onye ahu, nke ha nēsite n'aka-ya bia.


ma mma-agha gāduwa kwa nkpuru-obi gi onwe-gi; ka ewe kpughe èchìchè nke si n'ọtutu obi puta.


Ma ufọdu nime irọ-òtù ndi-Farisi ndi kwere na Jisus biliri, si, Aghaghi ibì ha úgwù, na inye ha iwu ka ha debe iwu Moses.


ndikom gēsite kwa n'etiti unu onwe-unu bilie, nēkwu ihe di iche iche nēduhie madu uzọ, ka ha dọpu ndi nēso uzọ Jisus iso ha n'azu.


Ma nka ka m'kwuputara gi, na dika Uzọ ahu si di nke ha nākpọ irọ-òtù, ọ bu otú a ka m'nēkpere Chineke nke nna-ayi-hà, ebe m'kwere ihe nile nke di ka iwu-ayi si di, nke edewo-kwa-ra n'akwukwọ ndi-amuma:


N'ihi na ayi huru nwoke a ka ọ nābu onye nēme ka ihe ọjọ ba uba, onye nākpali kwa madu n'etiti ndi-Ju nile n'elu-uwa dum madu bi ka ha bilie megide ndi-isi, buru kwa otù onye-isi nime irọ-òtù ndi Nazaret:


ebe ha buru uzọ maram site na mbu, ọ buru na ha chọrọ ib͕a àmà, na adim ndu ka onye-Farisi dika irọ-òtù ahu si di nke nēdebezu iwu kari n'uzọ ikpere Chineke ayi.


Ma ọ di ayi nma inu n'ọnu-gi ihe i tukwasiri uche-gi na ha: n'ihi na ihe bayere irọ-òtù a, ayi mazuru na anēkwugide ya ebe nile.


Ma onye-isi-nchu-àjà biliri, ya na ndi nile soro ya (nke bu irọ-òtù ndi-Sadusi), ha juputa-kwa-ra n'ekworo,


Ya mere mb͕e unu biakọrọ n'otù ebe, ọ bughi iri nri-anyasi nke Onye-nwe-ayi:


N'ihi na anamatu egwu, ma o nwere uzọ ọ bula, mb͕e m'gābia, m'gāhu unu ka unu nābughi aha madu ahu m'nāchọ, unu ahú kwa mu onwem ka m'nābu aha madu unu ṅachọghi; ma o nwere uzọ ọ bula esem-okwu, ekworo, ọnuma, ikpa-iche-iche, nkwutọ, ntakwu, nfuli-elu, aghara, gādi;


ikpere-arusi, igwọ-ńsí, ibu-iro, esem-okwu, ekworo, ọnuma, ikpa-iche-iche, nkewa, irọ-òtù,


egela nti okwu onye-amuma ahu, ma-ọbu ọrọ-nrọ ahu: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, nānwà unu, ima ma unu nēwere obi-unu nile na nkpuru-obi-unu nile hu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya.


Ju madu nke nārọ òtù, mb͕e i dusiri ya ọdu nke-mbu na nke-abua;


Ha siri n'etiti ayi pua, ma ha abughi ndi nke ayi; n'ihi na asi na ha bu ndi nke ayi, ha gānọgidewori n'etiti ayi: ma ha puru, ka ewe me ka ha puta ìhè na ha nile bu ndi nābughi ndi nke ayi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan