Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 10:31 - Bible Nso

31 Ya mere ma unu nēri ihe, ma unu nāṅu ihe, ma unu nēme ihe ọ bula, nēmenu ihe nile ka ewe nye Chineke otuto.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

31 Ihe ọbụla ị na-eme, ma unu na-eri ihe maọbụ na-aṅụ ihe, na-emenụ ha niile maka otuto nke Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 10:31
11 Iomraidhean Croise  

E, ite ọ bula nke di na Jerusalem, ma-ọbu nke di na Juda, gābu ihe nsọ Jehova nke usu nile nke ndi-agha nwere: ndi nile ndi nāchu àjà gābia kwa chiri ufọdu nime ha, sie ihe nime ha: ọ dighi kwa onye Kenean gādi ọzọ n'ulo Jehova nke usu nile nke ndi-agha n'ubọchi ahu.


Otú ọ di, werenu ihe di nime lua ọlu ebere; ihe nile di kwa ọcha n'ebe unu nọ.


Akpawo kwa ókè n'etiti nwunye na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke. Nwanyi nke nēnweghi di nēcheb͕u onwe-ya n'ihe nke Onye-nwe-ayi, ka o we di nsọ n'aru-ya na mọ-ya kwa: ma nwanyi nke nwere di nēcheb͕u onwe-ya n'ihe nke uwa, otú ọ gēme ihe gātọ di-ya utọ.


unu gāṅuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-unu, unu onwe-unu, na umu-unu ndikom, na umu-unu ndinyom, na orù-unu ndikom, na orù-unu ndinyom, na onye Livai nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-unu ọ bula; n'ihi na o soghi unu nwe òkè ma-ọbu ihe-nketa.


kama ọ bu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, ka i gēri ha, n'ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na onye Livai nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula: i gāṅuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, na nseti aka-gi ọ bula.


unu gēri kwa ihe n'ebe ahu n'iru Jehova, bú Chineke-unu, unu gāṅuri kwa ọṅu n'ihe nile unu nēseti aka-unu ime, unu onwe-unu na ulo-unu, nke Jehova, bú Chineke-gi, gọziworo gi nime ha.


Ihe nile ọ bula unu nēme kwa, n'okwu ma-ọbu n'ọlu, nēmenu ha nile n'aha Onye-nwe-ayi Jisus, nēkele Chineke, bú Nna-ayi, site n'aka-Ya.


ihe ọ bula unu nēme, nālunu ọlu site na nkpuru-obi-unu, dika unu nāluru Onye-nwe-ayi ọlu, ọ bughi kwa madu;


ọ buru na onye ọ bula nēkwu okwu, ya kwue dika okwu nke si Chineke n'ọnu puta; ọ buru na onye ọ bula nēje ozi, ya je dika o sitere n'ike ahu Chineke nēnyezu: ka ewe nye Chineke otuto n'ihe nile site n'aka Jisus Kraist, Onye nwe ebube nile na ike nile rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan