Anyu-ike, ọ̀ ga-egbu onwe ya n'aru onye ji ya eb͕u ihe? ma-ọbu mma-nkwọ, ọ̀ gēme onwe-ya uku megide onye nākwọ ya? dika agāsi na ndele gēfeghari ndi nēbuli ya, dika agāsi na nkpa-n'aka gēbuli onye nābughi osisi.
Ma ayi matara na ka ha ra, bú ihe iwu Chineke nēkwu, ọ nāgwa ndi nọ n'okpuru iwu ahu; ka ewe kpuchita ọnu nile n'otù n'otù, ka ewe kwe na ikpé mara uwa nile n'ebe Chineke nọ:
N'ihi na Ònye nākpa ókè n'etiti gi na madu-ibe-gi? ọ̀ bu gini kwa ka i nwere nke i nānataghi? ma ọ buru na i natara ya, gini mere i nānya isi, dika agāsi na i nataghi ya?