Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 1:26 - Bible Nso

26 N'ihi na lenu ọkpukpọ-unu, umu-nnam, na ọ dighi ọtutu ndi mara ihe dika anu-aru si mara ihe, ọ dighi ọtutu ndi-ike, ọ dighi ọtutu ndi amazuru aha-ha, ka akpọrọ:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 Ụmụnna m, chetakwanụ ihe unu bụ mgbe a kpọrọ unu. Chetanụ na ọ bụ ole na ole nʼime unu bụ ndị maara ihe nʼusoro ogugo mmadụ, ndị dị ike, na ndị a maara aha ha nʼobodo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 1:26
24 Iomraidhean Croise  

Otù onye we ba, gosi onye-nwe-ya, si, Otú a na otú a ka nwa-ab͕ọghọ ahu nke sitere n'ala Israel kwuru.


N'ihi ya madu nātu egwu Ya: Ọ dighi-ahu ndi nile obi-ha mara ihe.


M'gēme kwa ka otù ndi ewedara n'ala nke nēnweghi kwa ike fọdu n'etiti gi, ha gāb͕abà kwa n'aha Jehova.


ọ di-kwa-ram nma, ebe m'soro ihe nile nke-ọma site na mbu, ka m'dere gi ka o si me, Teọfilọs di oké ebube;


N'oge hour ahu tọrọ Ya utọ nke-uku nime Mọ Nsọ, O we si, Ekelem Gi, Nna, Onye-nwe elu-igwe na uwa, na I zonariri ndi-amam-ihe na ndi nwere nghọta ihe ndia, I were kwa ha kpughere umu ọhu: e, Nna; ekelem Gi na ọ di ezi nma otú a n'iru Gi.


Mb͕e ahu onye-isi ahu, mb͕e ọ huru ihe meworo, o kwere, ebe ibobo ozizí nke Onye-nwe-ayi nwuru ya n'aru.


onye ya na onye-isi nọ, bú Sajiọs Pọlọs, nwoke nwere nghọta. Onye ahu kpọtāra onwe-ya Banabas na Sọl, we chọ inu okwu Chineke.


Ma ndikom ufọdu rapara n'aru-ya, we kwere na Jisus: n'etiti ha Daiọnisiọs onye Areọpagọs di kwa, na otù nwanyi, aha-ya bu Damaris, ha na ndi ọzọ.


N'ihi na nchèghari adighi n'onyinye-amara nile na ọkpukpọ nke Chineke.


Òle ebe onye mara ihe nọ? òle ebe ode-akwukwọ nọ? òle ebe onye oge a, onye ya na ibe-ya nājurita ajuju, nọ? Chìneke emeghi ka amam-ihe uwa buru ihe-nzuzu?


Ọ bu kwa ihe ndia ka ayi nēkwu, ọ bughi n'okwu nke amam-ihe madu nēzí, kama n'okwu nke Mọ Nsọ nēzí; ayi nēwere kwa ihe nke Mọ Nsọ tule ihe nke Mọ Nsọ.


nke ọ dighi onye ọ bula n'etiti ndi-isi oge a mara: n'ihi na asi na ha mara ya-ri, ha agaghi-akpọgidewori Onye-nwe ebube n'obe:


Ndi nsọ nile nēkele unu, ma ndi nke èzí-na-ulo Sisa kachasi n'ikele unu.


Nurunu, umu-nnam ndi m'huru n'anya; Chìneke arọputaghi ndi bu ob͕eye n'ihe nke uwa ka ha buru ndi-ọgaranya n'okwukwe, buru kwa ndi-nketa nke ala-eze ahu nke O kwere nkwa inye ndi huru Ya n'anya?


Okenye nēdegara nwanyi-nwe-madu, bú onye arọputaworo, akwukwọ, ya na umu-ya, ndi mu onwem nāhu n'anya n'ezi-okwu; ọ bughi kwa nání mu onwem, kama ọ bu kwa ndi nile ndi maworo ezi-okwu ahu;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan