22 Ebe ndi-Ju nāriọ ihe-iriba-ama di iche iche, ndi-Grik nāchọ kwa amam-ihe:
22 Ndị Juu chọrọ ịhụ ihe ịrịbama, ndị Griik na-achọkwa amamihe.
O nye-kwa-ra ihe-iriba-ama n'ubọchi ahu, si, Nka bu ihe-iriba-ama ahu nke Jehova kwuworo: Le, agāb͕awa ebe-ichu-àjà nka, wusi kwa ntu nke di n'elu ya.
Ndi-Farisi we puta, malite iju Ya ajuju, nāchọ ihe-iriba-ama n'aka-Ya site n'elu-igwe, n'inwa Ya.
Ndi ọzọ nāchọ ihe-iriba-ama n'aka-Ya site n'elu-igwe, n'ihi na ha nānwa Ya.
Ma ọ buru na Mu onwem achupu ndi-mọ ọjọ n'ike nkpisi-aka Chineke, ya mere ala-eze Chineke ruru unu aru.
Ya mere ndi-Ju zara, si Ya, Ọ̀ bu ihe-iriba-ama gini ka I nēgosi ayi, ebe I nēme ihe ndia?
Ya mere nwanyi ahu rapuru ite-miri-ya, we je ba nime obodo, si ndi ahu,
Ya mere Jisus siri ya, Ọ buru na unu ahughi ihe-iriba-ama na ọlu-ebube, unu agaghi-ekwe ma-ọli.