Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 9:1 - Bible Nso

1 O rue, mb͕e Solomon wubìri ulo Jehova, na ulo eze, na ihe nile nke di Solomon ezi nma n'obi nke tọrọ ya utọ ime,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Mgbe Solomọn rụchara ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ụlọeze, rụzukwaa ihe niile bụ nke o bu nʼobi ime,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 9:1
18 Iomraidhean Croise  

Solomon we ghọ ọgọ Fero eze Ijipt, kuru nwa-nwayi Fero, me ka ọ bata n'obodo Devid, rue mb͕e o wusiri ulo-ya, na ulo Jehova, na mb͕idi Jerusalem buruburu.


N'arọ nke-anọ ka atọrọ ntọ-ala ulo Jehova, n'ọnwa Ziv.


Ma Solomon nọ arọ iri na atọ n'iwu ulo nke aka ya, ọ we wubìe ulo-ya nile.


O we wue ulo oké ọhia Lebanon; ọgu cubit ise ka ogologo-ya di, ọgu cubit abua na iri ka obosara-ya di kwa, orú cubit na iri ka idi-elu-ya di, ọ di n'elu akuku anọ nke ogidi osisi cedar, osisi cedar awara awa di kwa n'elu ogidi ahu.


Ewe jezue ozi nile nke eze, bú Solomon, jere n'ulo Jehova. Solomon we webata ihe nile Devid, bú nna-ya, doro nsọ, bú ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe nile, o we tiye ha n'ulo-àkù nke ulo Jehova.


N'ubọchi nke-asatọ o zilagara ndi Israel, ha we gọzie eze, la n'ulo-ikwū-ha nāṅuri ọṅu, obi di kwa ha nma, n'ihi ezi ihe nile nke Jehova mere Devid, bú orù-Ya, nke O me-kwa-ra Israel, bú ndi-Ya.


O rue, n'ọgwugwu orú arọ, nke Solomon wuru ulo abua nime ha, bú ulo Jehova na ulo eze,


(ma Hairam, bú eze Taia, were osisi cedar, were kwa osisi fir, were kwa ọla-edo, yere Solomon aka, dika ihe nile si di nke nātọ ya utọ,) na eze Solomon nyere Hairam orú obodo n'ala Galili mb͕e ahu.


na obodo nile nke nchikọbata-ihe nke Solomon nwere, na obodo nile nke ub͕ọ-ala-ya, na obodo nile nke ndi-inyinya-ya, na ihe di Solomon ezi nma n'obi, bú nke di ya ezi nma n'obi iwu na Jerusalem, na nime Lebanon, na n'ala nile ọ nāchi.


Ma mb͕e Solomon kpebìri ekpere, ọku siri n'elu-igwe ridata, we ripia àjà-nsure-ọku na àjà nile; ebube Jehova we juputa ulo ahu.


Solomon we wubìe ulo Jehova, na ulo eze: ma ihe nile nke batara n'obi Solomon ime n'ulo Jehova na n'ulo-ya, o mere ka ha ga nke-ọma.


O rue, n'ọgwugwu orú arọ, nke Solomon wuru ulo Jehova na ulo-ya nime ha,


na Bealat, na obodo nile nke nchikọbata-ihe nke Solomon nwere, na obodo nile nke ub͕ọ-ala-ya, na obodo nile nke ndi-inyinya-ya, na ihe nile di Solomon ezi nma n'obi, bú nke di ya ezi nma n'obi iwu na Jerusalem, na nime Lebanon, na n'ala nile ọ nāchi.


Ma ihe ọ bula anyam abua riọrọ, anapughm ha ihe ahu: eb͕ochighm obim n'ọǹù ọ bula, n'ihi na obim ṅuriri ọṅu site na ndọb͕u nile m'dọb͕uru onwem n'ọlu; nka bu kwa òkèm nke sitere na ndọb͕u nile m'dọb͕uru onwem n'ọlu.


Emerem ka ọlum nile di uku; ewurum onwem ulo di iche iche, kuara onwem ubi-vine di iche iche,


Ọ di nma, bú ihe-ọhuhu nke anya abua, kari njeghari nke nkpuru-obi: nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan