Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 8:9 - Bible Nso

9 Ọ dighi ihe di n'ib͕e ahu, ọ bu nání mbadamba nkume abua nke Moses dọbara n'ebe ahu na Horeb, mb͕e Jehova na umu Israel b͕ara ndu, mb͕e ha siri n'ala Ijipt puta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 O nweghị ihe dị nʼime igbe ọgbụgba ndụ ahụ, karịakwa mbadamba nkume abụọ ahụ Mosis tinyere nʼime ya nʼugwu Horeb, nʼebe Onyenwe anyị na ụmụ Izrel gbara ndụ, mgbe ha si nʼala Ijipt pụta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 8:9
25 Iomraidhean Croise  

doro ib͕e ahu ọnọdu n'ebe ahu, bú ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu Jehova di n'ebe ahu, bú ọb͕ub͕a-ndu nke Ya na nna-ayi-hà b͕ara, mb͕e O mere ka ha si n'ala Ijipt puta.


Ọ dighi ihe di n'ib͕e ahu, ọ bu nání mbadamba nkume abua nke Moses tiyere nime ha na Horeb, mb͕e Jehova na umu Israel b͕ara ndu, mb͕e ha siri n'Ijipt puta.


Nkpa-n'aka di ogologo, ewe hu isi nkpa-n'aka site n'ib͕e ahu n'iru ime-ime-ulo ahu; ma adighi-ahu ha n'èzí: o we di n'ebe ahu, rue ta.


Ma Jehova nēje n'iru ha n'ehihie n'ogidi igwe-oji, iduru ha n'uzọ; na n'abali n'ogidi ọku, inye ha ìhè; ka ha we nēje ehihie na abali:


O rue, nime iche-nche ututu, na Jehova lere ọmuma-ulo-ikwū ndi Ijipt anya n'ogidi ọku na igwe-oji, chusa ọmuma-ulo-ikwū ndi Ijipt.


O rue, mb͕e Eron nāgwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, na ha chere ọzara iru, ma, le, ahuru ebube Jehova n'igwe-oji ahu.


Moses we si Eron, Were otù ite, tiye nju omer nke manna nime ya, dọba ya n'iru Jehova ka ọ buru ihe-ndebe anēdebere ọb͕ọ nile unu.


I gētiye kwa n'ib͕e ahu ihe-àmà M'gēnye gi.


I gātukwasi kwa ebe-nkpuchi-nmehie ahu n'ib͕e ahu, n'elu ya; nime ib͕e ahu ka i gētiye ihe-àmà nke M'gēnye gi.


O were ihe-àmà ahu tiye n'ib͕e ahu, tukwasi nkpa-n'aka-ya abua n'ib͕e ahu, tiyekwasi ebe-nkpuchi-nmehie n'ib͕e ahu n'elu:


Ebube Jehova we si n'elu cherub rigo, guzo n'elu nbata-uzọ nke ulo ahu; ulo ahu we juputa n'igwe-oji ahu; ogige-ya juputa-kwa-ra n'onwunwu-ìhè nke ebube Jehova.


Jehova we si Moses, Gwa Eron, bú nwa-nne-gi, okwu, ka ọ ghara ibata mb͕e nile n'ebe nsọ a nime ákwà-nb͕ochi, n'iru ebe-nkpuchi-nmehie nke di n'elu ib͕e ahu; ka ọ we ghara inwu: n'ihi na nime igwe-oji ka agāhum n'elu ebe-nkpuchi-nmehie.


Jehova we si Moses, Doghachi nkpa-n'aka Eron n'iru ihe-àmàm ka ọ buru ihe-ndebe, iburu umu nnupu-isi ihe-iriba-ama; ka i we me ka ntamu nile ha si n'ebe M'nọ bìsia, ka ha we ghara inwu.


N'ubọchi eguzoro ebe-obibi ahu ọtọ igwe-oji ahu kpuchiri ebe-obibi, ọbuna ulo-ikwū nzute: ma n'anyasi ọ di n'elu ebe-obibi ahu dika ọku, n'ile ya anya, rue ututu.


Were akwukwọ iwu a, tiye ya n'akuku ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, bú Chineke-unu, ka o we di n'ebe ahu ibu ihe-àmà megide gi.


Ọ we gosi unu ọb͕ub͕a-ndu-Ya, nke Ọ nyere unu iwu ime, bú okwu iri ahu; Ọ we de ha n'elu mbadamba nkume abua.


nke nwere ebe-ichu-àjà ọla-edo isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke amachitara ọla-edo gburugburu n'akuku nile, nke ite ọla-edo nke nwere manna di nime ya, ya na nkpa-n'aka ahu nke Eron nke mara ifuru, na mbadamba nkume abua nke ọb͕ub͕a-ndu ahu;


Ulo nsọ ahu we juputa n'anwuru-ọku nke si n'ebube Chineke puta, si kwa n'ike-Ya puta; ọ dighi kwa onye ọ bula puru ibà nime ulo nsọ ahu, rue mb͕e ihe-otiti asa ahu nke ndi-mọ-ozi asa ahu gāgwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan