Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 8:6 - Bible Nso

6 Ndi-nchu-àjà we bubata ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova n'ebe-ya, nime ime-ime-ulo nke ulo ahu, rue ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, rue n'okpuru nkù cherubim.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ndị nchụaja bubatara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nʼime ime ụlọnsọ ukwu ahụ, nʼime Ebe Kachasị Nsọ, dọba ya nʼokpuru nku cherubim ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 8:6
21 Iomraidhean Croise  

Ha we bubata ib͕e Jehova, guzo ya n'ọnọdu-ya, n'etiti ulo-ikwū nke Devid mara nye ya: Devid we sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo n'iru Jehova.


Devid we bilie, si na Beale Juda je, ya na ndi Israel nile ndi ya na ha nọ, isi n'ebe ahu bugota ib͕e Chineke, nke akpọkwasiri Aha, bú aha Jehova nke usu nile nke ndi-agha Onye nānọkwasi cherubim.


O were ibo osisi cedar wue ebe di orú cubit n'azu ulo ahu, site n'ala ulo rue mb͕idi: o were ha wuere ya nime, ibu ime-ime-ulo, ibu ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile.


O dozi-kwa-ra ime-ime-ulo n'etiti ulo ahu nime, itiye ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova n'ebe ahu.


O we tiye cherubim n'etiti ime-ulo: ha we b͕asa nkù cherubim ahu, nkù nke otù we metu mb͕idi, nkù cherub nke-ọzọ nēmetu kwa mb͕idi nke-ọzọ; nkù-ha nēmeturita onwe-ha, nkù na nkù, n'etiti ulo ahu.


Ndi-okenye nile nke Israel we bia, ndi-nchu-àjà we bulie ib͕e ahu.


Ha we bugota ib͕e Jehova, na ulo-ikwū nzute, na ihe nsọ nile nke di n'Ulo-ikwū ahu; ndi-nchu-àjà na ndi Livai we bugota ha.


N'ihi na cherubim nāb͕asa nkù-ha rue ebe ib͕e ahu, cherubim we nēkpuchi ib͕e ahu na nkpa-n'aka-ya abua n'elu.


Ub͕u a werenu obi-unu na nkpuru-obi-unu nye ichọ Jehova, bú Chineke-unu; bili-kwa-nu, wue ebe nsọ Jehova, bú Chineke, ibubata ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, na ihe nsọ nile nke Chineke, n'ulo nke anēwuru aha Jehova.


Ndi-nchu-àjà we bubata ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova n'ebe-ya, nime ime-ime-ulo nke ulo ahu, rue ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, rue n'okpuru nkù cherubim.


Gi Onye nāzu Israel dika aturu, ṅa nti, Gi Onye nēdu Josef dika ìgwè ewu na aturu; Gi Onye bi n'etiti cherubim, nwuputa ka ìhè.


N'iru Efraim na Benjamin na Manase, kpọte idi-ike-Gi, Je izọputa ayi.


Jehova bu eze; ka ndi nile di iche iche ma jijiji: Ọ nēbi n'etiti cherubim; ka uwa me nkpatu.


Cherubim ahu nāb͕asa kwa nkù-ha n'elu, nēkpuchi ebe-nkpuchi-nmehie na nkù-ha, iru-ha nēcherita kwa onwe-ha; n'ebe ebe-nkpuchi-nmehie di ka iru cherubim ahu di.


Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel, Onye nēbi n'etiti cherubim, Gi onwe-gi bu Chineke, nání Gi, nke ala-eze nile nke uwa; Gi onwe-gi mere elu-igwe na uwa.


Anu-kwa-ra olu nkù nile nke cherubim rue ogige di n'èzí, dika olu nke Chineke Nke puru ime ihe nile mb͕e Ọ nēkwu okwu.


O we tùa ogologo-ya, orú cubit, na obosara-ya, orú cubit, n'iru ulo uku Chineke: o we sim, Nka bu ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile.


Ndi Israel we ziga na Shailo, ha we si n'ebe ahu bute ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Onye bi n'etiti cherubim: umu-ndikom Ilai abua, bú Họfnai na Finehas, nọye-kwa-ra ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke n'ebe ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan