Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 8:48 - Bible Nso

48 ọ buru kwa na ha ewere obi-ha nile, were kwa nkpuru-obi-ha nile, laghachikute Gi n'ala ndi-iro-ha, bú ndi dọtara ha n'agha, ha ewe kpere Gi n'uzọ ala-ha, nke I nyere ndi bu nna-ha, na obodo ahu nke I rọputaworo, na ulo nke m'wuworo aha-Gi:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

48 ọ bụrụ na ha ejiri obi ha na mmụọ ha niile chegharịa, nʼala ebe ndị iro ha, bụ ndị dọọrọ ha nʼagha, ma kpee ekpere nye gị chee ihu ha nʼụzọ ala a nke i nyere nna nna ha, nʼobodo a nke ị họpụtara, ya na nʼụlọnsọ ukwu a m wuru nye Aha gị;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 8:48
27 Iomraidhean Croise  

Mb͕e anētib͕u ndi-Gi, bú Israel, n'iru onye-iro, n'ihi na ha nēmehie megide Gi; ọ buru na ha alaghachikute Gi, kwuputa aha-Gi, kpe ekpere, riọ Gi amara n'ulo a:


Gi nuru kwa n'elu-igwe, bú ọnọdu obibi-Gi guzosiri ike, ekpere-ha na aririọ-amara-ha, mezie ikpé-ha;


Ọ dighi eze nke buru ya uzọ di ka ya, onye were obi-ya nile, were kwa nkpuru-obi-ya nile, were kwa ike-ya nile, chigharikute Jehova, dika iwu nke Moses si di; ọ dighi kwa onye ọzọ dika ya biliri mb͕e ọ nwusiri.


ma asi na unu alaghachikutem, we debe ihe nile M'nyere n'iwu me kwa ha, ọ buru na ndi-unu anāchufu adi na nsọtu elu-igwe, site n'ebe ahu ka M'gāchikọta ha, me ka ha biarue ebe ahu nke M'rọputaworo ime ka aham biri n'ebe ahu.


Obim nile ka m'wereworo chọ Gi: Ekwela ka m'si n'ihe nile I nyere n'iwu jehie.


Ewerewom obim nile kpọ nkpu; zam, Jehova: Ukpuru-Gi nile ka m'gēchebe.


Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēchebe ihe-àmà-Ya nile bu, Ndi nēwere obi-ha nile chọ Ya.


Nwam, nyem obi-gi, Ka uzọm nile tọ kwa anya-gi abua utọ.


M'gēnye kwa ha obi imaram, na Mu onwem bu Jehova: ha gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke: n'ihi na ha gēji obi-ha nile laghachikutem.


Ma ọbuná n'ihe a nile nwa-nne-ya nwayi nke nāghọb͕u, bú Juda, ejighi obi-ya nile laghachikutem, kama o ji okwu-ugha, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ma Daniel, mb͕e ọ mara na akayewo aha n'ihe ahu edere n'akwukwọ, o we bata n'ulo-ya: (ma o nwere window ufọdu ghere oghe n'ime-ulo-elu-ya chere iru na Jerusalem;) ọ bu kwa ub͕ò atọ n'ubọchi ka ya onwe-ya nēb͕u ikperè-ya n'ala nēkpe ekpere, nēkele ekele n'iru Chineke-ya, n'ihi na otú a ka ọ nēmeri site na mb͕e gara aga.


Mb͕e ahu ndikom ndia were oké nkpọtu b͕akọta, chọputa Daniel ka ọ nāriọ aririọ, nāriọ kwa aririọ-amara n'iru Chineke-ya.


Dika edeworo ya n'akwukwọ iwu Moses, ihe ọjọ a nile abiakwasiwo ayi: ma ayi emeghi ka iru Jehova, bú Chineke-ayi, dajua, ka ayi we si n'ajọ omume nile ayi chigharia, nwe uche n'ezi-okwu-Gi.


ayi emehiewo, me ajọ omume, mebie iwu, nupu isi, we si n'ihe nile I nyere n'iwu na n'ikpé-Gi nile wezuga onwe-ayi:


Ha gēkwuputa ajọ omume-ha, na ajọ omume nke ndi bu nna-ha, nime nmekpu-ha nke ha mekpurum, ha gēkwuputa kwa na n'ihi na ha jeghariri n'imegidem,


Mu onwem we si, Achupuwom n'iru anya-Gi abua; Otú ọ di, m'gēlegide kwa anya ọzọ n'ebe ulo uku Gi di nsọ di.


M'gāgha kwa ha dika nkpuru n'etiti ndi nile di iche iche; ọ bu kwa n'ebe nile di anya ka ha gēchetam: ha gādi kwa ndu, ha na umu-ha, we lata.


Ma mb͕e ha nāga n'uzọ, ha biaruru otù miri; onozi ahu we si, Le, miri; gini nānapu imem baptism?


n'ihi na anēji obi kwere rue ezi omume; anēji kwa ọnu kwuputa rue nzọputa.


Ma asi na i si n'ebe ahu chọ Jehova, bú Chineke-gi, i gāchọta kwa Ya, mb͕e i were obi-gi nile na nkpuru-obi-gi nile jua ase Ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan