Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 8:35 - Bible Nso

35 Mb͕e eb͕ochiri elu-igwe, mb͕e miri-ozuzo nādighi kwa, n'ihi na ha nēmehie megide Gi; ọ buru na ha ekpe ekpere n'ebe a, kwuputa aha-Gi, si na nmehie-ha laghachi, n'ihi na I nēweda ha n'ala:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

35 “Mgbe e gbochiri eluigwe, mee na mmiri adịghị ezokwa, nʼihi na ndị gị emehiela megide gị, ọ bụrụ na ha echee ihu nʼebe a kpee ekpere, too aha gị, si na mmehie ha chegharịa, nʼihi na ịtaala ha ahụhụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 8:35
30 Iomraidhean Croise  

Obi Devid we ta ya uta mb͕e ọ gusiri ndi Israel. Devid we si Jehova, Emehiewom nke-uku n'ihe m'meworo: ma ub͕u a, Jehova, biko me ka ajọ omume-orú-Gi gabiga; n'ihi na emewom ihe-nzuzu nke-uku.


Gad we biakute Devid, si, ya, Ọ̀ bu oké unwu arọ asa gābiakute gi n'ala-gi? mà-ọbu na i ganāb͕alaga n'iru ndi nākpab͕u gi ọnwa atọ, mb͕e ndi ahu nāchu gi: mà-ọbu na ajọ ọria nēfe efe gādi n'ala-gi ubọchi atọ? ub͕u a mata, le kwa okwu m'gēweghachiri Onye nēzitem.


Elaija, bu onye Tisbe, onye sitere na ndi-nnọdu nke Gilead, we si Ehab, Jehova, bú Chineke nke Israel, nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, igirigi ma-ọbu miri-ozuzo agaghi-adi ma-ọli n'arọ ndia, ma ọ bu nání dika okwum si di.


Mb͕e anētib͕u ndi-Gi, bú Israel, n'iru onye-iro, n'ihi na ha nēmehie megide Gi; ọ buru na ha alaghachikute Gi, kwuputa aha-Gi, kpe ekpere, riọ Gi amara n'ulo a:


Gi onwe-gi nuru kwa n'elu-igwe, b͕aghara nmehie ndi-Gi, bú Israel, me ka ha lata n'ala nke I nyere ndi bu nna-ha.


Ọ buru kwa na etib͕ue ndi-Gi, bú Israel, n'iru onye-iro, n'ihi na ha nēmehie megide gi; ọ buru kwa na ha alaghachi, kwuputa aha-Gi, kpe ekpere, riọ amara n'iru Gi n'ulo a:


Mb͕e eb͕ochiri elu-igwe, mb͕e miri-ozuzo nādighi kwa, n'ihi na ha nēmehie megide Gi; ọ buru na ha ekpe ekpere n'ebe ebe a di, kwuputa aha-Gi, si na nmehie-ha laghachi, n'ihi na I nēweda ha n'ala:


Le, Ọ nēb͕ochi miri, ha takọrọ; Ọzọ, ọ nēzipu ha, ha we kpùe uwa iru.


m'gēme kwa ka ọ gwusia; agaghi-akwacha vine-ya, agaghi-edozi kwa ya; ma ogwu na uke gētoputa: igwe-oji nile ka m'gēnye kwa iwu ka ha ghara izokwasi ya miri.


Ma ndi nka alaghachikuteghi Onye nētib͕u ha, ọ bughi kwa Jehova nke usu nile nke ndi-agha ka ha chọworo.


Nwa nke madu, mb͕e ala ọ bula nēmehie megidem n'imekpu ihe-nmekpu, M'we setipu akam imegide ya, b͕ajiere ya nkpa-n'aka, bú achicha, zite oké unwu nime ya, bipu madu na anumanu nime ya;


Israel, laghachikute Jehova, bú Chineke-gi; n'ihi na i suwo ngọngọ site n'ajọ omume-gi.


M'egetiji nweli-elu nke ike-unu; M'gēme kwa elu-igwe-unu ka ọ di ka ígwè, me kwa ala-unu ka ọ di ka ọla:


N'ihi nka ka elu-igwe nke di n'elu unu b͕ochiworo igirigi, ala eb͕ochiwo kwa ihe-omume-ya.


Ọ gēru kwa, na ab͕uru ọ bula n'etiti ab͕uru nile nke uwa nke nādighi-arigota na Jerusalem ikpọ isi ala nye Eze, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, miri agaghi-ezokwasi ha.


Webatanu otù uzọ n'uzọ iri nile n'ulo-àkù nkem, ka ihe-oriri we di n'ulom, biko, nwanum na nka, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, ma M'gaghi-emeghere unu window nile nke elu-igwe, wusara unu ngọzi, rue mḅe ọnọdu agaghi-ezu inagide ya.


Ma n'ezie ka M'nāsi unu, Ọtutu ndinyom di-ha nwuru di n'ala Israel n'ubọchi Elaija, mb͕e emechiri elu-igwe arọ atọ na ọnwa isi, mb͕e oké unwu dara n'ala ahu nile;


na ọ buru na i gēwere ọnu-gi kwuputa Jisus na Ọ bu Onye-nwe-ayi, ọ buru kwa na i gēwere obi-gi kwere na Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, agāzọputa gí:


ka ndi mba ọzọ we nye kwa Chineke otuto n'ihi ebere-Ya; dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, N'ihi nka ka M'gēkwuputa Gi n'etiti mba nile, Aha-Gi ka m'gābùku kwa abù ọma.


Lezienu onwe-unu anya, ka ewe ghara irafu obi-unu, unu ewe wezuga onwe-unu, fè chi ọzọ òfùfè, kpọ isi ala nye ha;


iwe Jehova we di ọku megide unu, O we b͕ochie elu-igwe, ka miri-ozuzo we ghara idi, ka ala we ghara kwa imi ihe-ọmume-ya; unu we si n'ezi ala ahu, nke Jehova nēnye unu, la n'iyì ngwa ngwa.


Jehova gēmeghere gi ezi ulo-àkù-Ya, bú elu-igwe, inye miri-ozuzo nke ala-gi na mb͕e-ya, na igọzi omume nile nke aka-gi; i gēbinye kwa ọtutu mba ihe, ma gi onwe-gi agaghi-ebiri ihe.


Ndia nwere ike imechi elu-igwe, ka miri we ghara izo n'ubọchi nile nke amuma-ha: ha nwe-kwa-ra ike n'ebe miri nile di, ime ka ha b͕anwè ọbara, na iwere ihe-otiti nile ọ bula tie uwa, ka mb͕e ha gāchọ ra.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan