1 Ndị Eze 8:30 - Bible Nso30 Ge kwa nti aririọ-amara orù-Gi, na nke ndi-Gi, bú Israel, mb͕e ha nēkpe ekpere n'ebe ebe a di: Gi onwe-gi nuru kwa n'ebe obibi-Gi, n'elu-igwe; mb͕e I nuworo, Gi b͕aghara. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a30 Nụrụkwa arịrịọ ohu gị na nke ndị gị Izrel niile, mgbe ọbụla ha chere ihu ha nʼebe a nʼekpere. Biko, site nʼeluigwe bụ ebe obibi gị nụrụ, mgbe ị nụrụ biko, gbagharakwa. Faic an caibideil |
N'ihi na otú a ka Ọ siri, bú Onye di elu, Nke eme-kwa-ra ka Ọ di elu, Onye nēbi ebi mb͕e nile ebighi-ebi, Onye Nsọ ka aha-Ya bu kwa: Ọ si, N'ebe di elu di kwa nsọ ka M'bi, M'biye-kwa-ra onye mọ-ya bu ihe azọpiara azọpia di kwa ala, ime ka mọ nke ndi di ume-ala n'obi di ndu, na ime ka obi nke ndi azọpiara azọpia nime mọ-ha di ndu.
Ma Daniel, mb͕e ọ mara na akayewo aha n'ihe ahu edere n'akwukwọ, o we bata n'ulo-ya: (ma o nwere window ufọdu ghere oghe n'ime-ulo-elu-ya chere iru na Jerusalem;) ọ bu kwa ub͕ò atọ n'ubọchi ka ya onwe-ya nēb͕u ikperè-ya n'ala nēkpe ekpere, nēkele ekele n'iru Chineke-ya, n'ihi na otú a ka ọ nēmeri site na mb͕e gara aga.