1 Ndị Eze 8:16 - Bible Nso16 Site n'ubọchi mb͕e M'mere ka ndim, bú Israel, si n'Ijipt puta, arọputaghm obodo n'ebo nile nke Israel iwu ulo, ka aham we di n'ebe ahu; ma arọputaram Devid ibu onye-isi ndim, bú Israel. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a16 ‘Site nʼụbọchị ahụ m si nʼala Ijipt kpọpụta ndị m, ahọpụtaghị m obodo ọbụla nʼebo ọbụla nke Izrel, ka e wuru m ụlọnsọ ka Aha m dịrị nʼebe ahụ. Ma a họrọla m Devid ị bụ onye ga-achị ndị m Izrel.’ Faic an caibideil |
ọ gēru kwa, na ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu, n'ebe ahu ka unu gēwebata ihe nile m'nēnye unu n'iwu; àjà-nsure-ọku nile unu, na àjà nile unu, na otù uzọ n'uzọ iri nke ihe-unu nile, na àjà-nbuli nke aka-unu, na ihe-nkwa-unu nile arọputara arọputa nke unu nēkwe Jehova: