Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 8:10 - Bible Nso

10 O rue, mb͕e ndi-nchu-àjà siri n'ebe nsọ puta, na igwe-oji juputara ulo Jehova,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Mgbe ndị nchụaja si nʼEbe Nsọ ahụ pụta, igwe ojii jupụtara ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 8:10
11 Iomraidhean Croise  

ndi-nchu-àjà we ghara inwe ike iguzo ije ozi n'ihi igwe-oji ahu: n'ihi na ebube Jehova juputara ulo Jehova.


Igwe-oji na oké ọchichiri di Ya buruburu: Ezi omume na ikpé ziri ezi bu ọnọdu guzosiri ike nke oche-eze-Ya.


O rue, mb͕e Eron nāgwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, na ha chere ọzara iru, ma, le, ahuru ebube Jehova n'igwe-oji ahu.


N'arọ nke ọnwu eze, bú Uzaia, m'we hu Onye-nwe-ayi ka Ọ nānọkwasi n'oche-eze di elu nke ebuliwo-kwa-ra elu, ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-Ya juputa-kwa-ra ulo uku Chineke.


Ntọ-ala nile nke nbata-uzọ nile we me nkpatu site n'olu onye ahu nke nākpọ òkù, ulo we juputa n'anwuru-ọku.


Ebube Jehova we si n'elu cherub rigo, guzo n'elu nbata-uzọ nke ulo ahu; ulo ahu we juputa n'igwe-oji ahu; ogige-ya juputa-kwa-ra n'onwunwu-ìhè nke ebube Jehova.


Jehova we si Moses, Gwa Eron, bú nwa-nne-gi, okwu, ka ọ ghara ibata mb͕e nile n'ebe nsọ a nime ákwà-nb͕ochi, n'iru ebe-nkpuchi-nmehie nke di n'elu ib͕e ahu; ka ọ we ghara inwu: n'ihi na nime igwe-oji ka agāhum n'elu ebe-nkpuchi-nmehie.


M'gēme kwa ka mba nile me nkpatu, ihe anāchọsi ike nke mba nile gābia kwa, M'gēmeju kwa ulo a n'ebube, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Ulo nsọ ahu we juputa n'anwuru-ọku nke si n'ebube Chineke puta, si kwa n'ike-Ya puta; ọ dighi kwa onye ọ bula puru ibà nime ulo nsọ ahu, rue mb͕e ihe-otiti asa ahu nke ndi-mọ-ozi asa ahu gāgwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan