O me-kwa-ra oké osimiri awuru awu, cubit iri site n'otù ọnu-ya rue ọnu-ya nke-ọzọ, ọ di gburugburu gburugburu, cubit ise ka idi-elu-ya di: eriri nke orú cubit na iri b͕a-kwa-ra ya buruburu.
Ọ nēguzo n'elu ehi iri na abua, atọ nēche iru n'Ugwu, atọ nēche iru n'Ọdida-anyanwu, atọ nēche iru na Ndida, atọ nēche iru n'Ọwuwa-anyanwu: oké osimiri ahu we dikwasi ha n'elu, azu-ha nile di kwa nime.