Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 7:27 - Bible Nso

27 Ọ me ihe-ndọkwasi iri nke ọla; cubit anọ ka ogologo otù ihe-ndọkwasi di, cubit anọ ka obosara-ya di kwa, cubit atọ ka idi-elu-ya di kwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 O mekwara ihe ndọkwasị bronz iri, nke e nwere ike ịkpụgharị akpụgharị. Mita abụọ ka ogologo nke otu ihe ndọkwasị ọbụla dị, mita abụọ ka obosara ya dịkwa; ịdị elu ya dị otu mita na ọkara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 7:27
10 Iomraidhean Croise  

Ib͕idi-ya di otù ntù-ọbu-aka; emere ọnu-ya dika anēme ọnu iko, dika okoko urodi: nnù bath ise ka ọ nānagide.


Ma nka bu otú emere ihe-ndọkwasi: ha nwere ihe-njikọ, bú ihe-njikọ n'etiti nkwukọta-ya:


O me kwa ite ọsisa-miri iri nke ọla: ọgu bath abua ka otù ite ọsisa-miri nānagide: cubit anọ ka ite ọsisa-miri ọ bula di: otù ite ọsisa-miri di n'elu ihe-ndọkwasi ọ bula n'ihe-ndọkwasi iri ahu.


Eze, bú Ehaz, we bipu ihe-njikọ nile nke ihe-ndọkwasi nile, si n'elu ha wezuga ite ọsisa-miri: o si-kwa-ra n'elu ehi ọla nke di n'okpuru ya weda oké osimiri ahu, tiye ya n'elu pavement nkume.


Ma ogidi ọla nile nke di n'ulo Jehova, na ihe-ndọkwasi nile na oké osimiri ọla nke di n'ulo Jehova, ndia ka ndi Kaldea tipiara, chiri ọla-ha je Babilon.


Ogidi abua ahu, otù oké osimiri ahu, na ihe-ndọkwasi nile, nke Solomon mere nye ulo Jehova; ọ dighi ọtùtù atùru ọla ihe ndia nile.


O me-kwa-ra ihe-ndọkwasi iri ahu, me kwa ite ọsisa-miri iri ahu nke di n'elu ihe-ndọkwasi;


N'ihi na okwu di otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru bayere ogidi nile, baye-kwa-ra oké osimiri ahu, baye-kwa-ra ihe-ndọkwasi nile, baye-kwa-ra ihe fọduru, bú nke fọduru n'obodo a,


Ma ogidi ọla nile nke di n'ulo Jehova, na ihe-ndọkwasi nile na oké osimiri ọla nke di n'ulo Jehova, ndia ka ndi Kaldea tipiara, chiri ọla-ha nile je Babilon.


Ogidi abua ahu, na otù oké osimiri ahu, na ehi iri na abua nke ọla nke di n'okpuru ihe-ndọkwasi-ya nile, nke eze, bú Solomon, mere nye ulo Jehova; ọ dighi ọtùtù atùru ọla ihe ndia nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan