Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 7:12 - Bible Nso

12 Ogige uku nke di buruburu nwe-kwa-ra akuku atọ nke nkume awara awa, na otù ariri nke osisi cedar awara awa; ọbuná dika ogige ime-ime ulo Jehova si enwe, na dika uzọ-nbata ulo si enwe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ogige ukwu ahụ bụ nke eji ahịrị nkume atọ a wara awa dịkwasịrị nʼelu ibe ya gbaa gburugburu, otu ahịrị bụ nke sida a wara awa dịka ọ dị nʼime ime ogige ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ, ya na mpụta ọnụ ụlọ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 7:12
9 Iomraidhean Croise  

Uzọ-nbata kwa nke di n'iru ulo uku nke ulo ahu, orú cubit ka ogologo-ya di, n'iru obosara ulo ahu; cubit iri ka obosara-ya di n'iru ulo ahu.


O were akuku nkume awara awa atọ na otù ariri osisi cedar awara awa wue ogige ime-ime.


Nkume nke di oké ọnu-ahia di kwa n'elu, dika ọtùtù nke osisi awara awa si di, na osisi cedar.


O me-kwa-ra uzọ-nbata nke ogidi; ọgu cubit abua na iri ka ogologo-ya di, orú cubit na iri ka obosara-ya di kwa; uzọ-nbata di kwa n'iru ha; ogidi na nbata-uzọ di kwa n'iru ha.


O wu-kwa-ra ebe-ichu-àjà nye usu nile nke ihe elu-igwe n'ogige abua nke ulo Jehova.


O me kwa ogige ndi-nchu-àjà, na ogige uku ahu, na ibo-ọnu-uzọ itiye n'ogige ahu, were ọla machita ibo-ọnu-uzọ-ha.


Jisus we nējeghari n'ulo uku Chineke n'ìbà Solomon.


Ma mb͕e o nējide Pita na Jọn aka, ndi-Ju nile b͕akọrọ n'ebe ha nọ n'ìbà nke anākprọ ìbà Solomon, ibobo nwuru ha n'aru nke-uku.


Ma emere ọtutu ihe-iriba-ama na ọlu-ebube n'etiti ndi-Ju site n'aka ndi-ozi; ha nile were kwa otù obi nọ n'ìbà Solomon.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan