Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 6:5 - Bible Nso

5 O wu-kwa-ra okpukpu-ulo n'akuku mb͕idi ulo ahu buruburu, bú mb͕idi nile nke ulo ahu buruburu, ma nke ulo uku Chineke ahu, ma nke ime-ime-ulo ahu: o me-kwa-ra ulo ntà nke akuku buruburu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Nʼakụkụ mgbidi ụlọ ezumezu ahụ nakwa mgbidi nke ime ebe nsọ ahụ, o wuru okpukpu gburugburu ụlọ ahụ, nke nwere ọtụtụ ụlọ nta dị iche iche gbaa gburugburu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 6:5
26 Iomraidhean Croise  

O were ibo osisi cedar wue ebe di orú cubit n'azu ulo ahu, site n'ala ulo rue mb͕idi: o were ha wuere ya nime, ibu ime-ime-ulo, ibu ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile.


O me ibo-uzọ osisi manu olive tiye n'ọnu-uzọ ime-ime-ulo ahu: ọfiere-uzọ na awara-uzọ abua bu otù uzọ n'uzọ ise nke mb͕idi.


Okpukpu-ulo nke dikarisiri ala, cubit ise ka obosara-ya di, okpukpu-ulo nke-etiti kwa, cubit isi ka obosara-ya di, okpukpu-ulo nke-atọ kwa, cubit asa ka obosara-ya di: n'ihi na o tiyere ngwe n'ulo ahu buruburu n'èzí, ka ihe we ghara ibà na mb͕idi ulo ahu.


N'ihi na ebe-nguzo-ha di n'akuku umu Eron ifè òfùfè ulo Jehova, n'ogige nile, na n'ime-ulo nile, na n'ime ka ihe nsọ ọ bula di ọcha, bú ọlu òfùfè ulo Chineke;


Devid we nye Solom nwa-ya ihe-atù nke uzọ-nbata ulo uku Chineke, na nke ulo-ya nile, na nke ulo-àkù-ya nile, na nke ime-ulo-elu-ya nile, na nke ime-ime-ulo-ya nile, na nke ulo ebe-nkpuchi-nmehie:


n'ihi na n'ọnọdu ndi kwesiri ntukwasi-obi ka ha nọ, bú ndi-dike anọ nke ndi-ọnu-uzọ-ama, ha onwe-ha bu ndi Livai, ha bu kwa ndi-isi ime-ulo nile na ndi-isi ulo-àkù nile nke ulo Chineke.


Hezekaia we si ka edozie ime-ulo n'ulo Jehova; ha we dozie.


na ihe-idọba-oriọna na oriọna nile ha, inwu enwu dika ikpé si di n'iru ime-ime-ulo ahu, ha bu ọla-edo makarisiri nma;


Ndi-nchu-àjà we bubata ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova n'ebe-ya, nime ime-ime-ulo nke ulo ahu, rue ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, rue n'okpuru nkù cherubim.


Nkpa-n'aka di ogologo, ewe hu isi nkpa-n'aka site n'ib͕e ahu n'iru ime-ime-ulo ahu; ma adighi-ahu ha n'èzí: o we di n'ebe ahu, rue ta.


na ayi gēwebata-kwa-ra ndi-nchu-àjà utu ọka mbu ayi, na àjà-nbuli nile ayi, na nkpuru nke osisi nile ọ bula, na manya-vine ọhu, na manu, rue ime-ulo nke ulo Chineke-ayi; webata-kwa-ra ndi Livai otù uzọ n'uzọ iri nke ihe ala-ubi-ayi; n'ihi na ha onwe-ha, bú ndi Livai, nānara otù uzọ n'uzọ iri n'obodo nile nke ọlu-ubi-ayi.


Ewe me ndikom ufọdu n'ubọchi ahu ka ha buru ndi nēlekọta ime-ulo nile nke idebe àkù, na idebe àjà-nbuli nile, na ibede nkpuru mbu, na idebe otù uzọ n'uzọ iri nile, ichikọbata nime ha, dika ubi obodo nile si di, òkè nile nke iwu nyere ndi-nchu-àjà na ndi Livai: n'ihi na ọṅù Juda di n'ihi ndi-nchu-àjà na n'ihi ndi Livai, bú ndi nēguzo eguzo.


Nuru olu aririọ-amaram nile mb͕e m'tikuru Gi, Mb͕e m'chiliri akam abua n'ebe ime-ime-ulo nke ebe nsọ Gi di.


M'gēzute kwa gi n'ebe ahu, kpayere gi uka site n'elu ebe-nkpuchi-nmehie, site n'etiti cherubim abua nke di n'elu ib͕e ihe-àmà ahu, bayere ihe nile nke M'gēnye gi n'iwu n'ebe umu Israel nọ.


Dọrọm; gi ka ayi gāb͕aso: Eze emewo ka m'ba n'ime-ulo-ya: Ayi gēteghari egwú ọṅù ṅuri kwa nime gi, Ayi gēhota ihu-n'anya-gi nile kari manya-vine: N'izi-ezi nile ka ha huworo gi n'anya.


Je n'ulo ndi Rikab, gwa ha okwu, me ka ha bata n'ulo Jehova, n'otù n'ime-ulo-ya, me ka ha ṅua manya-vine.


m'we me ka ha bata n'ulo Jehova, n'ime-ulo umu Henan nwa Igdalaia, bú onye nke Chineke, nke di n'akuku ime-ulo ndi-isi, nke di n'elu ime-ulo Maaseia nwa Shalum, bú onye-nche nke nbata-uzọ:


O we me ka m'bata n'ogige di n'èzí, ma, le, ime-ulo di iche iche na pavement di, nke emeworo nye ogige ahu buruburu n'akuku nile: orú ime-ulo na iri di na pavement ahu.


Ọzọ, n'èzí ọnu-uzọ-ama di nime ka ime-ulo nke ndi-abù di n'ogige di nime, nke di n'akuku ọnu-uzọ-ama nke Ugwu; iru-ha di kwa n'uzọ Ndida: otù di n'akuku ọnu-uzọ-ama nke Iru-anyanwu nke iru-ya di n'uzọ Ugwu.


O we tùa ogologo-ya, orú cubit, na obosara-ya, orú cubit, n'iru ulo uku Chineke: o we sim, Nka bu ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile.


Jehova we si Moses, Gwa Eron, bú nwa-nne-gi, okwu, ka ọ ghara ibata mb͕e nile n'ebe nsọ a nime ákwà-nb͕ochi, n'iru ebe-nkpuchi-nmehie nke di n'elu ib͕e ahu; ka ọ we ghara inwu: n'ihi na nime igwe-oji ka agāhum n'elu ebe-nkpuchi-nmehie.


Ma mb͕e Moses bara n'ulo-ikwū nzute ikpayere Ya uka, ọ we nu Olu ahu ka Ọ nāgwa ya okwu site n'elu ebe-nkpuchi-nmehie nke di n'elu ib͕e ihe-àmà ahu, site n'etiti cherubim abua ahu: O we gwa ya okwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan