Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 6:29 - Bible Nso

29 Ọ tu-kwa-ra mb͕idi nile nke ulo ahu buruburu n'eb͕ub͕u nke ihe-ọpipi, bú cherubim na nkwu na okoko-osisi wara awa, n'ime na n'èzí.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

29 Nʼahụ aja ụlọnsọ ukwu ahụ gbaa gburugburu, ma nʼime ọnụụlọ nke dị nʼime na ndị dị na mpụta, ka ọ pịkwasịrị oyiyi cherubim, osisi nkwụ na okoko osisi wara awa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 6:29
19 Iomraidhean Croise  

Osisi cedar di kwa n'aru ulo ahu nime, nke apiri ihe otutu, bú afufa-ọhia na okoko-osisi wara awa: ime ulo ahu nile bu osisi cedar; ọ dighi nkume ahuru anya.


Ọ machita cherubim ọla-edo.


Ọ machita-kwa-ra ala ulo ahu ọla-edo, n'ime na n'èzí.


Ibo-uzọ abua ahu bu osisi manu olive; ọ pia n'elu ha ihe-ọpipi, bú cherubim na nkwu na okoko-osisi wara awa, ọ machita ha ọla-edo; o tisa kwa ọla-edo n'aru cherubim, na n'aru nkwu.


O me-kwa-ra ákwà-nb͕ochi nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha, o we tua akika cherubim n'elu ya.


O were kwa ọla-edo kpuchie ulo ahu, bú ntuhie-ya nile, na nbata-uzọ-ya nile, na mb͕idi-ya nile, na ibo-ọnu-uzọ-ya nile; o b͕u-kwa-ra eb͕ub͕u cherubim na mb͕idi-ya nile.


Gọzienu Jehova, ndi-mọ-ozi-Ya, Unu ndi-dike di ike, ndi nēme okwu-Ya, N'ige nti olu nke okwu-Ya.


Tonu Ya, ndi-mọ-ozi-Ya nile: Tonu Ya, usu-ndi-agha-Ya nile.


Ma ub͕u a ihe-ya nile nke eb͕uru eb͕ub͕u, Ha nēwere anyu-ike ntà na otùtù di iche iche tipia ya n'otù.


Ebe-obibim ka i gēme kwa: were ákwà-nkwuba iri me ya; ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, nke emere ka ha yie cherubim, bú ọlu onye-ọ̀kà, ihe ndia ka i gēji me ha.


Onye ọ bula nke nwere obi amam-ihe n'etiti ndi nēje ozi ahu we me ebe-obibi ahu: were ákwà-nkwuba iri me ya; ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, nke emere ka ha yie cherubim, bú ọlu nke onye-ọ̀kà, ihe ndia ka o ji me ha.


Ọzọ, window emechiri emechi diri ime-ulo nile, di-kwa-ra akuku-ọnu-uzọ nile ha n'ime ọnu-uzọ-ama buruburu n'akuku nile, otú a ka window di-kwa-ra ulo-nbata nile: window di kwa n'ime ulo buruburu n'akuku nile: nkwu di kwa n'akuku-ọnu-uzọ ọ bula.


Ọ bu kwa ihe emeworo ka o yie cherubim na nkwu; otù nkwu di n'etiti cherub na cherub, iru abua ka cherub ọ bula nwere;


ka ewe me ub͕u a ka ibu-isi nile na ike nile nke di n'ebe di n'elu-igwe mara ọtutu okpukpu amam-ihe Chineke di iche iche site n'aka nzukọ-Ya,


Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu, ma le, oké ìgwè madu, nke onye ọ bula nāpughi iguta ọnu, ndi si na mba nile ọ bula, na ebo nile, na ndi nile, na asusu nile, puta, nēguzo n'iru oche-eze ahu na n'iru Nwa-aturu ahu, eb͕okwasiworo ha uwe-nwuda di ọcha, igu-nkwu di kwa n'aka-ha;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan