Ewe jezue ozi nile nke eze, bú Solomon, jere n'ulo Jehova. Solomon we webata ihe nile Devid, bú nna-ya, doro nsọ, bú ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe nile, o we tiye ha n'ulo-àkù nke ulo Jehova.
Ub͕ò atọ n'arọ ka Solomon surere àjà-nsure-ọku na àjà-udo nye Jehova n'elu ebe-ichu-àjà nke o wuru, o we sure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ tiyere ya n'elu ebe-ichu-àjà nke di n'iru Jehova. O we wuzue ulo ahu.