Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 5:9 - Bible Nso

9 Ndi-orùm gēsi na Lebanon buputa ha oké osimiri: mu onwem gāb͕a kwa ha ka ha se n'elu oké osimiri rue ebe ahu nke i gēziterem ozi, m'gātọsa kwa ha n'ebe ahu, gi onwe-gi gēburu kwa ha: gi onwe-gi gēme kwa ihe nātọm utọ, n'inye ulom nri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ndị ohu m ga-esi nʼugwu Lebanọn budaruo ha nʼosimiri Mediterenịa. A ga-ekekọta ha ọnụ, zitere gị ha nʼebe ị chọrọ ịnọ buru ha. Mgbe ha sere nʼelu mmiri rute ebe ị chọrọ, anyị ga-atọsakwara gị ha, ka i buru ha. Ma gị onwe gị ga-eme ihe bụ ọchịchọ m, site na-inye ndị ụlọ m ihe oriri.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 5:9
14 Iomraidhean Croise  

le, emewom dika okwu-gi si di: le, enyewom i obi mara ihe na nke nāghọta ihe; ya mere ọ dighi onye dika gi buru gi uzọ nọ, ọ dighi kwa onye gēbili dika gi n'azu gi.


Juda na Israel di ọtutu, dika ájá nke di n'akuku oké osimiri n'iba-uba, nēri ihe, nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nāṅuri kwa ọṅu.


Hairam we nēnye Solomon osisi cedar na osisi fir, bú ka ihe nile nātọ ya utọ ra.


Hairam we zigara Solomon ozi, si, Anuwom ozi nke i ziterem: mu onwem gēme ihe nile nātọ gi utọ bayere osisi cedar, baye-kwa-ra osisi fir.


Hairam we zìe ndi-orù-ya n'ub͕ọ-ya, bú ndi-ub͕ọ ndi mara oké osimiri, ha na ndi-orù Solomon.


Eze we me ọla-ọcha na ọla-edo ka ọ di ka nkume na Jerusalem, o me-kwa-ra osisi cedar ka ha di ka osisi sycomore nke di n'ebe di ala ala n'uba.


Ayi onwe-ayi gēb͕utu kwa osisi site na Lebanon, dika nkpà-gi nile si di: ayi gāb͕a kwa ha me ka ha se n'elu oké osimiri rue gi aru, rue Jafo; gi onwe-gi gēbugota kwa ha na Jerusalem.


Eze, bú Solomon, we di uku kari eze nile nke uwa n'àkù na amam-ihe.


Ha nye kwa ndi nāwa nkume, nye kwa ndi-ọ̀kà n'osisi, ego; ha nye kwa ndi Zaidon, nye kwa ndi Taia, ihe-oriri na ihe-ọṅuṅu na manu, ka ha we si na Lebanon bute osisi cedar rue oké osimiri, rue Jafo, dika nkwenye nke Sairọs, bú eze Peasia, kweyere ha.


N'ezie mọ di nime madu, Iku-ume nke Onye puru ime ihe nile nēme kwa ka ha ghọta ihe.


Mu onwem kpayere obim uka, si, Mu onwem, le, atukwasiwom n'onwem amam-ihe nke-uku kari onye ọ bula nke burum uzọ nime Jerusalem: e, obim ahuwo amam-ihe na ihe-ọmuma ri nne.


Juda na ala Israel, ndi ahu bu ndi-ahia-gi: ọka wheat nke Minit, na pannag, na manu-aṅu, na manu, na balm, ka ha jiri zu ihe-ahia-gi.


Ma Herod nēbu agha nke-uku megide Taia na Saidon n'obi-ya: ha we were otù obi biakute ya; mb͕e ha mesiri Blastọs eyì-ha, nke bu onye nēle ime-ulo-ndina nke eze anya, ha we riọ ka udo di n'etiti ha, n'ihi na esi n'ala nke eze ahu azù ala-ha.


Biko, ka m'gabiga, hu ezi ala ahu nke di n'ofè Jọdan, ezi ugwu ahu, na Lebanon.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan