Gi onwe gi amawo Devid, bú nnam, na ọ pughi iwuru aha Jehova, bú Chineke-ya, ulo n'ihi agha nke b͕ara ya buruburu, rue mb͕e Jehova tiyere ha n'okpuru ọbu-ukwu-ya abua.
na ihe-oriri nke table-ya, na nnọdu nke ndi-orù-ya, na nguzo nke ndi nējere ya ozi, na uwe-ha; na ndi-obu-ihe-ọṅuṅu-ya, na uwe-ha; na nrigo-ya nke ọ nārigo n'ulo Jehova; mọ adighi kwa nime ya ọzọ.