Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 5:12 - Bible Nso

12 Jehova nye-kwa-ra Solomon amam-ihe, dika Ọ gwara ya; udo we di n'etiti Hairam na Solomon; ha abua we b͕a ndu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Onyenwe anyị nyere Solomọn amamihe dị ukwuu dịka o kwere ya na nkwa. Hiram na Solomọn nwere mmekọ udo, ha abụọ gbakwara ndụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 5:12
12 Iomraidhean Croise  

Ha we b͕a ndu na Bia-sheba: Abimelek we bilie, ya na Faikol, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya, ha laghachi n'ala ndi Filistia.


Ọb͕ub͕a-ndu di n'etiti mu na gi, na n'etiti nnam na nna-gi: le, eziteworom gi onyinye, bú ọla-ọcha na ọla-edo; je, mebie ọb͕ub͕a-ndu gi na Beasha, bú eze Israel, b͕ara, ka o we si n'arum rigo.


le, emewom dika okwu-gi si di: le, enyewom i obi mara ihe na nke nāghọta ihe; ya mere ọ dighi onye dika gi buru gi uzọ nọ, ọ dighi kwa onye gēbili dika gi n'azu gi.


Chineke nye-kwa-ra Solomon amam-ihe na nghọta riri nne nke-uku, na obi sara mbara, dika ájá nke di n'usọ oké osimiri.


Eze, bú Solomon, we weputa usu ndi nēfè òfùfè n'Israel nile; usu ahu ndi nēfè òfùfè bu orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù iri-na-ise.


enyewo gi amam-ihe na ihe-ọmuma; M'gēnye kwa gi àkù, na ihe-nkpakọta, na nsọpuru, nke ndi-eze ndi buru gi uzọ nēnweghi otú a, ọ dighi kwa onye nke gēso gi gēnwe otú a.


Ọ buru na Jehova ewughi ulo, N'efu ka ha dọb͕uworo onwe-ha n'ọlu nime ya, bú ndi nēwu ya: Ọ buru na Jehova echeghi obodo, N'efu ka onye-nche muruworo anya.


Ilu di iche iche nke Solomon nwa Devid, bú eze Israel:


Ma tukwasi nka, n'ihi na Onye-nkpọkọta mara ihe, ọ nọ nēzí ndi-ya ihe-ọmuma; ọ ṅa-kwa-ra nti, we gwuputa, me ka ọtutu ilu dizie.


Abù nke abù, nke diri Solomon.


Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Taia, e, n'ihi anọ ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha mechibidoro otù ndi emere ka ha nile je biri n'ala ọzọ nye n'aka Edom, ha echetaghi kwa ọb͕ub͕a-ndu nke umu-nne:


Ma ọ buru na amam-ihe fọduru onye ọ bula nime unu inwe, ya riọ n'aka Chineke, Onye nēnye madu nile n'afọ-ofufọ, nātaghi kwa uta; agēwere kwa ya nye ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan