Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 4:33 - Bible Nso

33 O kwu-kwa-ra okwu bayere osisi, site na cedar nke di na Lebanon we rue hyssop nke nēpuputa na mb͕idi: o kwu-kwa-ra okwu bayere anu, baye-kwa-ra anu-ufe, baye-kwa-ra ihe nākpu akpu, baye-kwa-ra azù.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

33 O kwuru okwu banyere osisi, site na osisi sida nke Lebanọn ruo nʼahịhịa hisọp nke na-eto na mgbidi aja, na ihe banyere ụmụ anụmanụ na anụ ufe, na anụ na-akpụgharị nʼala nakwa azụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 4:33
13 Iomraidhean Croise  

Ọ tua nnù ilu asa na ọgu iri: abù-ya di kwa nnù abua na ọgu iri na abù ise.


Ha we si na ndi nile bia inu amam-ihe Solomon, si n'eze nile nke uwa, bú ndi nuru amam-ihe-ya.


I siri n'aka ndi-ozi-gi ta Onye-nwe-ayi uta, si, Ọtutu ub͕ọ-alam ka mu onwem jiri rigorue ebe di elu nke ugwu ime, rue akuku nile Lebanon; m'gēb͕utu kwa osisi cedar ya nile toro ogologo, na osisi fir ya nile arọputara arọputa: m'gābà kwa n'ebe-nnọdu-abali nke nsọtu-ya, oké ọhia nke ubi ọma ya.


I gēwere hyssop wepu nmehiem, m'gādi kwa ọcha: I gāsucham dika ákwà, m'gādi kwa ọcha kari snow.


Onye ezi omume gāwa igù dika nkwu: Dika osisi cedar nime Lebanon ka o gēbù ibù.


Unu gēwere kwa ùkwù hyssop, sue ya n'ọbara nke di n'ọkwa, were ya jua ọbara ufọdu nke di n'ọkwa elu-uzọ na n'awara-uzọ abua; unu onwe-unu agaghi-apu kwa, onye ọ bula n'ọnu-uzọ ulo-ya, rue ututu.


Si na Lebanon som, nwunye ọhu nkem, Si na Lebanon som: Site n'elu Amana le anya, Site n'elu Senia na Heamon, Site n'ebe-obibi nile nke ọdum. Site n'ugwu nile nke agu.


Ogwe-ukwu-ya abua di ka ogidi marble, nke atọworo ntọ-ala-ha n'elu ukwu ọla-edo anuchara anucha: Iru-ya di ka Lebanon, mara nma nke-uku dika cedar.


ọ gēwere kwa osisi cedar ahu, na hyssop ahu, na ogho uhie ahu, na nnunu ahu di ndu, sue ha nime ọbara nnunu ahu eb͕uru eb͕u na nime miri ahu nērù erù, fesa kwa ulo ahu ub͕ò asa:


nwoke nke di ọcha gēwere kwa hyssop, sue ya na miri ahu, fesa ya n'ulo-ikwū ahu, na n'ihe-ya nile, na n'aru ndi nọ n'ebe ahu, na n'aru onye ahu nke metuworo ọkpukpu ahu, maọbu onye eb͕uru eb͕u ahu, ma-ọbu onye nwuru anwu ahu, maọbu ílì ahu, aru:


Dika ndagwurugwu di iche iche ka esetiworo ha, Dika ubi di iche iche ab͕ara ogige n'akuku osimiri, Dika osisi lign-aloes nke Jehova kuworo, Dika osisi cedar n'akuku miri.


N'ihi na mb͕e Moses gwarari ndi Israel nile ihe nile ọ bula enyere n'iwu dika iwu ahu si di, ọ nara ọbara nke umu-ehi na ewu nile, ya na miri na aji-anu uhie na hyssop, we fesa akwukwọ ahu onwe-ya, na ndi Israel nile,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan