Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 4:29 - Bible Nso

29 Chineke nye-kwa-ra Solomon amam-ihe na nghọta riri nne nke-uku, na obi sara mbara, dika ájá nke di n'usọ oké osimiri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

29 Chineke nyere Solomọn amamihe, na uche nghọta, na mmụọ ịmụta ọtụtụ ihe nke bara ụba dịka aja dị nʼakụkụ osimiri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 4:29
19 Iomraidhean Croise  

Josef we kwakọba ọka dika ájá nke oké osimiri, nēme ka ọ ba uba nke-uku, rue mb͕e ọ rapuru igu ya ọnu; n'ihi na ọ dighi nguta.


le, emewom dika okwu-gi si di: le, enyewom i obi mara ihe na nke nāghọta ihe; ya mere ọ dighi onye dika gi buru gi uzọ nọ, ọ dighi kwa onye gēbili dika gi n'azu gi.


Israel nile we nu ikpe eze kpere; ha we tua egwu eze: n'ihi na ha huru na amam-ihe Chineke di nime ya, ime ihe ekpere n'ikpe.


Juda na Israel di ọtutu, dika ájá nke di n'akuku oké osimiri n'iba-uba, nēri ihe, nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nāṅuri kwa ọṅu.


N'uzọ nke ihe nile I nyere n'iwu ka m'gāb͕a ọsọ, N'ihi na I gēme ka obim sa mbara.


Me ka m'ghọta ihe, m'gēchebe kwa iwu-Gi; M'gēwere kwa obim nile debe ya.


N'ihi na Jehova nēnye amam-ihe; N'ọnu-Ya ka ihe-ọmuma na nghọta si aputa:


Mu onwem kpayere obim uka, si, Mu onwem, le, atukwasiwom n'onwem amam-ihe nke-uku kari onye ọ bula nke burum uzọ nime Jerusalem: e, obim ahuwo amam-ihe na ihe-ọmuma ri nne.


N'ihi na ọ bu madu nke di nma n'iru Ya ka Chineke nyeworo amam-ihe, na ihe-ọmuma, na ọṅù: ma ọ bu onye-nmehie ka O nyeworo nweda-n'ala, ichikọta na ikpokọta, ka o we nye onye di nma n'iru Chineke ihe. Nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe.


Mb͕e ahu i gāhu we nwue enwu, obi-gi gātu kwa oké egwu, sa mbara; n'ihi na agēchigharikute gi ihe bara uba nke oké osimiri, àkù nke mba di iche iche gābiakute gi.


Otú agaghi-agu usu ihe di n'elu-igwe ọnu, na otú agaghi-atùta ájá nke oké osimiri; otú a ka M'gēme ka nkpuru Devid, bú orùm, na ndi Livai ndi nējerem ozi, ba uba.


ọ bu Ya onwe-ya nāb͕anwe mb͕e na mb͕e akara àkà: Ọ nēwezuga ndi-eze, nēme kwa ka ndi-eze bilie: Ọ nēnye ndi mara ihe amam-ihe-ha, Ọ nēnye kwa ndi mara nghọta ihe-ọmuma:


Ha nile nābia ime ihe-ike; edosiri iru-ha ike dika ifufe Iru-anyanwu; ha we chikọta ndi adọtara n'agha dika ájá.


Ezi onyinye ọ bula na ihe ọ bula zuru okè nke enyere enye si n'elu bia, ebe o si n'aka Nna nke ìhè ridata, Onye ọghugha ọ bula nāpughi idi n'ebe Ọ nọ, ma-ọbu onyinyo nke nchighari nēweta.


Ma ọ buru na amam-ihe fọduru onye ọ bula nime unu inwe, ya riọ n'aka Chineke, Onye nēnye madu nile n'afọ-ofufọ, nātaghi kwa uta; agēwere kwa ya nye ya.


Ma amam-ihe ahu nke si n'elu bia buru uzọ di ọcha, emesia ọ di udo, nwe obi-ọma, nēkweye okwu nke-ọma, juputa n'ebere na ezi nkpuru, nēnweghi obi-abua, nēnweghi iru-abua.


Ma ndi Midian na ndi Amalek na umu Iru-anyanwu nile nāmade nime ndagwurugwu ahu dika igurube n'uba; iguta-ọgugu adighi kwa camel-ha, dika ájá nke di n'usọ oké osimiri n'uba.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan